Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Job 20
Okwu Zofa
Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:
“Enweghị udo nke echiche m na-akpali m izaghachi
nʼihi na anọ m na mwute dị ukwuu.
Anụla m okwu mkparị nke ileda anya nye m,
ma nghọta m na-akpalịte m ịzaghachi gị.
“Nʼezie, ị maara otu ọ dị site na mgbe ochie,
ya bụ kemgbe e debere mmadụ nʼụwa.
Obi ụtọ nke onye na-emebi iwu na-adị nwa mgbe nta,
ọṅụ nke ndị na-amaghị Chineke na-anọ naanị nwa oge.
Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe,
na isi ya ga-emetụkwa igwe ojii;
ọ ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ;
ndị maara ya ga-ajụ, ‘Olee ebe ọ nọ?’
Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla,
dịka ọhụ abalị nke e chefuru echefu.
Anya hụrụ ya na mbụ agaghị ahụkwa ya ọzọ,
ebe obibi ya agaghị elegidekwa ya anya ọzọ.
Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye;
aka ya abụọ kwa ga-enyeghachi akụ ya.
Ọkpụkpụ ya nke jupụtara nʼike okorobịa
ga-eso ya bụrụ ihe a ghanyere na ntụ.
“Ọ bụ ezie na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ nʼọnụ,
na ọ na-ezokwa ya nʼokpuru ire ya;
ọ bụ ezie na ọ pụghị nʼịhapụ ya,
ọ na-edebe ya nʼọnụ ya,
ma nri ọ na-eri ga-aghọ ihe gbara ụka nʼafọ ya,
ọ ga-aghọkwa elo agwọ nʼime afọ ya.
Ọ ga-agbọpụta akụnụba niile o lodara;
Chineke ga-eme ka o si nʼafọ ya gbọpụtachaa ha.
Ọ ga-amịcha elo agwọ,
eze agwọ ajụala ga-egbu ya.
Ọ gaghị anụ ụtọ mmiri si nʼiyi,
bụ iyi nke na-asọ asọ nke jupụtara na mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.
Ihe ọ rụpụtara ka ọ ga-eji kwụghachi ụgwọ o ji na-erighị ma otu.
Uru ọ zụtara nʼahịa agaghị abụrụ ya ihe ọṅụ.
Nʼihi na ọ kpagburu ndị ogbenye, hapụ ha na-enweghị olileanya ọbụla,
ọ nakọtakwara ụlọ nke ọ na-ewughị.
“Nʼezie, ọ gaghị enwe izuike site nʼoke ọchịchọ ya;
ọ gaghị azọpụtakwa onwe ya site nʼụlọakụ ya.
Ọ dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa,
ọganihu ya agaghị adịgide.
Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya,
oke ịta ahụhụ ga-adakwasị ya.
Mgbe o rijuru afọ
ka Chineke ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide ya,
iti aka Chineke ga-adakwasị ya dịka mmiri ozuzo.
Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga,
àkụ nke e ji ọla bronz kpụọ ọnụ ya ga-amapu ya ahụ.
Nʼazụ ya ka ọ na-esi mịpụta ya,
site nʼumeju ya ka a ga-esi mịpụta ọnụ ya na-egbu amụma.
Oke egwu dị iche iche ga-abịakwasị ya.
Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya,
ọkụ nke a na-afụnwughị afụnwu ga-erepịa ya
ọ ga-erechapụkwa ihe niile fọdụrụ nʼụlọ ikwu ya.
Eluigwe ga-ekpughe ikpe ọmụma ya
ụwa niile ga-ebili megide ya.
Idee mmiri ga-ebupu ụlọ ya;
oke mmiri okwukwo nʼụbọchị iwe Chineke.
Nke a bụ oke nke Chineke debeere ndị na-emebi iwu,
ya bụkwa ihe nketa nke Chineke kwadooro ha.”
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.