Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Jeremaya 47

Ozi e ziri banyere ndị Filistia

Okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere ndị Filistia. Okwu ndị a bịara tupu Fero ebuso obodo Gaza agha.

Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

“Lee ka mmiri si ala elu nʼakụkụ ugwu;

ha ga-aghọkwa mmiri nke na-erubiga oke.

Ha ga-erukwasị ala ahụ, kpuchiekwa ihe niile dị nʼime ya,

ọ ga-ekpuchikwa obodo niile dị nʼala ahụ, na ndị bi nʼime ya.

Ndị niile bi nʼala ahụ ga-eti mkpu akwa,

mmadụ niile ga-akwasikwa akwa ike.

Mgbe ha ga-anụ ụzụ ikiri ụkwụ nke ọtụtụ ịnyịnya, nke na-agbata ọsọ na-abịa nʼebe ha nọ,

mgbe ha ga-anụkwa ụzụ ụgbọ agha ndị iro,

na ụzụ nzọ ụkwụ igwe ha.

Nʼoge ahụ, ndị bụ nna agaghị enwe ike nyere ụmụ ha aka,

nʼihi na aka ha ga-akụda nʼakụkụ ha.

Nʼihi na ụbọchị ahụ abịala

mgbe a ga-ebibi ndị Filistia niile,

mgbe a ga-ebipụ ndị niile fọdụrụ,

ndị nwere ike inyere obodo Taịa na Saịdọn aka.

Nʼihi na Onyenwe anyị akwadoola ibibi ndị Filistia,

o kwadoola ibibi ndị ahụ fọdụrụ nʼọnụ mmiri Kafto.

Gaza ga-akpụcha isi ya nʼọnọdụ iru ụjụ.

A ga-eme ka Ashkelọn dere duu.

Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-egbukasị onwe unu ahụ,

unu bụ ndị fọdụrụ afọdụ bi nʼala dị larịị?

“ ‘Ewoo, gị mma agha Onyenwe anyị,

ole mgbe ị ga-ezu ike?

Mịnye onwe gị nʼọbọ gị,

kwụsị ịkpa ike gị ma dere duu.’

Ma ọ ga-esikwanụ aṅaa zuru ike,

ebe ọ bụ Onyenwe anyị nyere ya iwu

ibu agha megide Ashkelọn,

na ndị bi nʼọnụ mmiri oke osimiri?”

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.