Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Jeremaya 15

Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Ọ bụrụ na Mosis na Samuel apụta bịa guzo nʼihu m, ụdịdị obi m agaghị agbanwe nʼebe ndị a nọ. Chụpụ ha nʼihu m. Mee ka ha si nʼebe a pụọ. Ọ bụrụ na ha ajụọ gị si, ‘Ebee ka anyị ga-aga?’ Gwa ha na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

“ ‘Ndị e debere nʼihi ọnwụ ga-anwụ,

ndị e debere nʼihi mma agha ka mma agha ga-egbu;

ndị e debere nʼihi ụnwụ ka ụnwụ ga-egbu,

otu a kwa, ndị e debere nʼihi ịdọta nʼagha, ka a ga-adọta nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.’

“Aga m ezite ụdị mbibi anọ megide ha: mma agha nke ga-egbu ha, nkịta ga-adọkpụrụ ozu ha pụọ, ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa dị iche iche ga-eripịa ha, ma bibiekwa ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Aga m eme ka ha ghọọ ihe a na-asọ oyi nʼalaeze niile nke ụwa, nʼihi ihe Manase nwa eze Hezekaya nke Juda mere na Jerusalem.

“Onye ga-enwe ebere nʼahụ gị, gị Jerusalem?

Onye ga-eru ụjụ nʼihi ihe ga-adakwasị gị?

Onye ga-apụta guzo ịjụ ajụjụ banyere otu ihe si agara gị?

Gị onwe gị ajụla m,”

ka Onyenwe anyị kwupụtara.

“Ị nọgidela na-adaghachi azụ.

Ya mere, aga m ebikwasị gị aka, bibie gị.

Ike m ji akwụsị gị ka ị ghara ịdaghachi azụ agwụla m.1

Aga m eji ihe e ji afụcha ọka fụchaa ha

nʼọnụ ụzọ ama nke ala ahụ.

Aga m eme ka mbibi bịakwasị ndị m, nke ga-eme ka ha gbara aka ụmụ,

nʼihi na ha esitebeghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.

Aga m eme ka ọnụọgụgụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ baa ụba.

Ha ga-ehi nne karịa aja dị nʼọnụ oke osimiri.

Nʼetiti ehihie ka m ga-eme ka onye mbibi

bịakwasị ndị bụ nne ụmụ okorobịa ha;

na mberede ka m ga-eme ka nhụju anya

na ihe oke egwu bịakwasị ha.

Nwanyị mụrụ ụmụ asaa ga-ada mba,

kubie ume.

Ọ ga-anwụ mgbe oge ya na-erubeghị,

ihere ga-eme ya; ọ ga-abụkwa onye e wedara nʼala.

Ma ndị fọdụrụ ndụ ka m ga-eme ka ha nwụọ

site na mma agha ndị iro ha.”

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Ahụhụ dịịrị m, nne m, na ị mụrụ m,

onye ya na ndị niile bi nʼala a na-alụ ọgụ, ma na-ese okwu.

O nwebeghị onye m binyere ego, ọ dịkwaghị onye binyere m ego,

ma mmadụ niile na-akọcha m.

Onyenwe anyị kwuru sị,

“Nʼezie, aga m anapụta gị nʼihi ezi ihe,

aga m eme ka onye iro gị rịọ gị arịrịọ

nʼoge ihe ọjọọ na nʼoge mkpagbu.

“Mmadụ o nwere ike ịgbaji igwe,

ya bụ igwe e si nʼakụkụ ugwu bubata, maọbụ bronz?

“Aga m ewere ihe niile i nwere, ya na akụnụba gị,

nye ya onye ga-akwata ha nʼagha. Ọ gaghị akwụ gị ihe ọbụla.

Nʼihi na mmehie gị niile

ejupụtala nʼala a niile.

Aga m ewere gị nye ka ị bụrụ ohu ndị iro gị.

Ị ga-ebi nʼala ị na-amaghị.

Nʼihi na a ga-esite nʼiwe m mụnye ọkụ

nke ga-eregbu gị.”

Ị maara O Onyenwe anyị,

ya mere cheta m, lekọtaakwa m.

Bọọrọ m ọbọ megide ndị na-akpagbu m.

Ewezugala m, biko, nʼihi na ị bụ onye ogologo ntachiobi.

Lee ka m si na-anata nkọcha nʼihi na m na-asọpụrụ gị.

Mgbe m chọpụtara okwu gị, eweere m ya rie dịka nri.

Ha tọrọ obi m ụtọ, bụrụkwa ihe na-enye m ọṅụ,

nʼihi na-akpọkwasịrị m aha gị,

Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.

O nwebeghị oge mụ na ndị na-achị ọchị nke ukwuu ji nọkọọ.

Esokwaghị m ha ṅụrịkọọ ọṅụ.

A nọdụụrụ m onwe m nʼihi na aka gị dịkwasịrị m.

I mekwara ka iwe jupụta m nʼobi nʼihi ajọ omume ha.

Gịnị mere ihe mgbu m adịghị akwụsị akwụsị?

Gịnị mekwara ọnya m ji dị njọ na-apụghị ịgwọta ya?

Ị dịrị m dịka mmiri iyi na-arafu mmadụ,

dịka isi iyi nke na-ekwesighị ntụkwasị obi.

Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

“Ọ bụrụ na i chegharịa, aga m etinyeghachi gị nʼọnọdụ gị,

ime ka i guzokwa nʼihu m.

Ọ bụrụ na okwu si gị nʼọnụ abụrụ okwu kwesiri ntụkwasị obi, okwu na-abụghị okwu nzuzu

ị ga-abụ onye na-ekwuchitere m ọnụ m.

Ndị a ga-alaghachikwute gị

ma i gaghị alaghachikwuru ha.

Aga m eme ka ị dịrị ka mgbidi nʼebe ha nọ.

Ị ga-abụ mgbidi e wusiri ike, nke e ji bronz wuo.

Ha ga-ebuso gị agha,

ma ha agaghị emeri gị

nʼihi na m nọnyeere gị ịnapụta gị,

nakwa ịzọpụta gị,”

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

“Aga m anapụta gị site nʼaka ndị ọjọọ.

Gbapụtakwa gị site nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.”

Source notes (1)
  1. Footnote Agaghị m enwekwa ọmịiko nʼebe ị nọ ọzọ

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.