Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Jeremaya 10

Chineke na arụsị

Nụrụnụ ihe Onyenwe anyị na-agwa unu, ụmụ Izrel. Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru,

“Unu amụtala ụzọ ndị mba ọzọ,

unu atụkwala ụjọ ihe ịrịbama niile nke na-apụta ihe na mbara eluigwe,

ọ bụ ezie na ndị mba dị iche iche na-atụ ha ụjọ.

Nʼihi na omenaala ndị mmadụ ahụ abaghị uru.

Ha na-aba nʼọhịa gbute osisi,

nke onye ǹka osisi na-eji anyụike pịara ha ihe.

Ha na-eji ọlaọcha na ọlaedo chọọ ihe ahụ a pịrị apị mma,

jiri mkpirisi igwe na ǹtu kụọ ya ka o sie ike,

ka ọ ghara ịda.

Arụsị ha yiri osisi eguzobere nʼubi kukumba maka iji chụọ anụ ufe ọsọ,

ha adịghị ekwu okwu.

A na-ebugharị ha nʼaka

nʼihi na ha adịghị eje ije.

Unu atụla ha egwu,

nʼihi na ha apụghị imerụ unu ahụ,

ha enwekwaghị ike imere unu ihe ọma ọbụla.”

O nweghị onye dịka gị, Onyenwe anyị.

Ị dị ukwuu.

Aha gị dị ukwuu, na-arụpụtakwa ihe dị ike.

Onye ka ọ bụ nke na-ekwesighị ịtụ gị egwu?

Ọ bụ gị bụ eze mba niile.

Ọ bụkwa gị ka e kwesiri ịtụ egwu.

Nʼetiti ndị niile maara ihe na mba niile,

na nʼalaeze niile,

ọ dịghị onye dịka gị.

Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu.

Ọ bụkwa arụsị osisi na-abaghị uru na-ezi ha ihe.

A na-esite na Tashish bubata ọlaọcha e tipịaziri nke ọma,

site na Ụfaz bubata ọlaedo.

Ihe ahụ nke ọka osisi pịrị, nke ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo chọrọ mma

ka a na-eyikwasị uwe na-acha anụnụ anụnụ, na uwe na-acha odo odo.

Ọ bụkwa ndị ǹka dị iche iche na-eme ha niile.

Ma naanị Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie.

Ọ bụ Chineke dị ndụ, na Eze nke ebighị ebi.

Mgbe iwe were ya, ụwa na-ama jijiji.

Mba niile apụghịkwa ịnagide iwe ya dị ọkụ.

“Ihe ndị a ka unu ga-agwa ha, ‘Chi ndị ahụ niile a na-esiteghị nʼaka ha mee eluigwe na ụwa niile ga-ala nʼiyi. A ga-ewezuga ha site nʼụwa na nʼokpuru eluigwe niile.’ ”

Ma Chineke sitere nʼike ya mee ụwa.

Ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya,

ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile.

Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa.

Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie.

Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo,

na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya niile na-ewepụta ifufe.

Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ.

Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ.

Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ;

ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha.

Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo,

mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi.

Ma Onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a,

nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile,

tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya.

Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.

Mbibi nke na-abịa

Chịkọtaanụ ngwongwo unu niile; nọọnụ na njikere ịhapụ ala a,

nʼihi na lee, ndị iro gbara unu gburugburu.

Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

“Nʼoge a, aga m amafu

ndị niile bi nʼala a.

M ga-eme ka oke mkpagbu bịakwasị ha,

meekwa ka ndị iro ha jide ha.”

Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ.

Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ.

Ma ana m akasị onwe m obi na-asị,

“Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.”

Ebibiela ụlọ ikwu m,

e tibisiala ụdọ ya niile.

Ụmụ m ndị ikom esitela nʼebe m nọ pụọ, ha anọkwaghị ya.

Ọ dịkwaghị onye fọdụrụ nke ga-enyere m aka isetipụ ụlọ ikwu m,

maọbụ onye ga-edoziri m ebe m ga-anọ zuo ike.

Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche.

Ha adịghị ajụta ase site nʼaka Onyenwe anyị,

ya mere, na ihe adịghị agara ha nke ọma,

igwe atụrụ ha niile agbasasịakwala.

Gee ntị, nụrụ! Lee ozi na-abịa,

oke ụzụ nke ọgbaaghara site nʼala dị nʼugwu,

ime ka obodo niile nke Juda tọgbọrọ nʼefu,

ghọọkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa.

Ekpere Jeremaya

O Onyenwe anyị, amaara m na ụzọ mmadụ adịghị nʼaka ya,

na ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-agbaso.

Ya mere, Onyenwe anyị, site nʼụzọ nke ikpe ziri ezi dọọ m aka na ntị,

ma ọ bụghị site nʼiwe gị,

ma ọ bụghị ya, ị ga-eme ka m ghọọ ihe efu.

Wụkwasị ọnụma gị nʼelu mba niile dị iche iche

bụ ndị na-amaghị gị,

wụkwasịkwa ya ndị ahụ niile na-adịghị akpọku aha gị.

Nʼihi na ha eripịala Jekọb,

ha eripịala ya kpamkpam,

bibiekwa ebe obibi ya.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.