Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Aịzaya 66

Ikpe ikpe na olileanya

Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu,

“Eluigwe bụ ocheeze m,

ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m.

Ọ bụ ụdị ụlọ gịnị ka ị ga-ewuru m?

Ebee ka ebe izuike m ga-adị?”

Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile,

mee ka ha ji dịrị?

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

“Ma olee ndị ihe ha na-atọ m ụtọ,

ọ bụ ndị ahụ nwere obi umeala, ndị na-adịghị ebuli onwe ha elu,

ndị na-amakwa jijiji nʼokwu m.

Ma onye ọbụla nke na-achụ aja ehi

dịka nwoke na-egbu mmadụ,

onye ọbụla jikwa nwa atụrụ achụ aja

dị ka onye na-agbaji nkịta olu,

onye ọbụla na-achụ aja mkpụrụ ọka

dị ka onye na-eche ọbara ezi,

otu a kwa, onye ọbụla na-esure ụda na-esi isi ụtọ nke ncheta

dị ka onye na-efe arụsị.

Ha ahọpụtarala onwe ha ụzọ nke ha,

ha na-enwekwa mmasị nʼihe arụ ha niile.

Ya mere, aga m ezitere ha ahụhụ dị egwu,

mee ka ihe ahụ ha na-atụ egwu ya bịakwasị ha.

Nʼihi na mgbe m kpọrọ ha oku, ha azaghị,

mgbe m gwara ha okwu, ha egeghị ntị.

Kama ha mere ihe ọjọọ nʼihu m,

họrọkwa ime ihe ndị ahụ ha maara na m kpọrọ asị.”

Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị,

unu ndị na-ama jijiji nʼokwu ya,

“Ụmụnna unu, ndị kpọrọ unu asị,

ndị chụpụkwara unu nʼihi aha m, ekwuola sị,

‘Ka a sọpụrụ Onyenwe anyị!

Ka anyị lee ụdị ọṅụ ga-abụ nke unu!’

Ma a ga-etinye ha nʼọnọdụ ihere.

Ọ bụ gịnị bụ mkpọtụ dị nʼime obodo?

Gịnị bụ oke ụzụ na-ada nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị?

Ọ bụ ụzụ Onyenwe anyị na-eme.

Onye ahụ na-akwụghachi ndị iro ya ụgwọ ruuru ha.

“Tupu ime amalite ime ya,

ọ mụpụtalarị nwa ya.

Tupu ihe mgbu ya ebido,

ọ mụpụtala nwa nwoke.

Onye jiri ntị ya nụtụ ihe dị otu a mbụ?

Onye kwa ji anya ya hụ ihe dị otu a?

A pụrụ ịmụpụta otu mba nʼotu ụbọchị?

Ka e nwere ike ime ka otu obodo malite ịdị nʼotu ntabi anya?

Lee na tupu ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ya ebido

Zayọn amụpụtala ụmụ ya.

Mụ onwe m, m ga-eme ka nwa rute nʼoge ọmụmụ

gharakwa ime ka a mụọ ya?”

ka Onyenwe anyị na-ekwu.

“M ga-emechi akpanwa

mgbe m na-eme ka a mụpụta ya?”

ka Chineke gị jụrụ.

“Soronụ Jerusalem ṅụrịa ọṅụ, soronụ ya nwee obi ụtọ,

unu ndị niile hụrụ ya nʼanya;

soronụ ya ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu,

unu ndị ruru ụjụ nʼihi ya.

Nʼihi na ihe banyere Jerusalem ga-atọ unu ụtọ.

Unu ga-aṅụjukwa ara nkasiobi ya afọ,

ọ bụladị dịka nwantakịrị si enwe obi ụtọ

mgbe ọ na-aṅụ ara nne ya nke na-agba nke ọma.”

Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

“Aga m eme ka udo bara ya ụba dịka osimiri,

mee ka akụnụba niile nke ndị mba ọzọ dịrị ka mmiri na-asọbiga oke.

Ọ ga-elekọta gị, kurukwa gị, makụọkwa gị nʼaka ya,

wugharịakwa gị nʼikpere ya.

Dịka nne si akasị nwa ya obi,

otu a ka m ga-esi kasịe unu obi.

Ọ bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi.”

Mgbe ị hụrụ ihe ndị a, obi gị ga-aṅụrị ọṅụ,

ịga awasa dịka ahịhịa ọhụrụ;

a ga-emekwa ka aka Onyenwe anyị pụta ìhè nʼebe ndị ohu ya nọ,

ma a ga-egosi ndị iro ya oke iwe ya.

Nʼihi na lee, Onyenwe anyị ga-eji ọkụ bịa.

Ụgbọala ya ga-adịkwa ka oke ifufe.

Ọ ga-eji ọnụma gosi iwe ya,

werekwa ọkụ na-enwu enwu baa mba.

Nʼihi na Onyenwe anyị ga-eji ọkụ na mma agha ya

kpee ndị mmadụ niile ikpe.

Ọ ga-egbukwa ọtụtụ mmadụ.

“Ndị ahụ niile na-edo onwe ha nsọ, ndị na-eme onwe ha ka ha dị ọcha nʼihi ịbanye nʼubi a gbara ogige, ndị ahụ na-eso onye ahụ nọ nʼetiti ndị ahụ na-eri anụ ezi, na oke, na ihe ndị ọzọ ahụ niile rụrụ arụ, ga-ezute ọnwụ nke nọ na-eche ha niile.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

“Ma mụ onwe m, amaara m nke ọma ihe ha zubere ma meekwa, ana m abịa ịchịkọta mba niile na-asụ asụsụ dị iche iche. Ha niile ga-abịakwa hụ ebube m.

“Aga m edokwa ihe ịrịbama nʼetiti ha, zipụkwa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti ha ka ha gaa nʼobodo Tashish, na Libiya,1 na Lidiya2 (ndị na-agba àkụ nʼụta nke ọma) na Tubal, na Griis. E, ha ga-eje na mba niile nke dị anya, nʼofe osimiri, ebe ndị bi nʼime ya na-anụbeghị ihe banyere ịdị ukwuu nke m, maọbụ hụ ebube m. Ha ga-ekwusakwa ihe banyere ebube m nʼetiti mba niile dị iche iche. Ha ga-akpọghachi ụmụnne unu niile site na mba niile, bịa nʼugwu nsọ m dị na Jerusalem, dịka onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị. Ha ga-ebute ha nʼelu ịnyịnya, nʼụgbọ agha, nʼelu ụgbọala a na-adọkpụ adọkpụ, nʼelu ịnyịnya muul na nʼelu ịnyịnya kamel,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Ha ga-ebubata ha dịka mgbe ndị Izrel na-ewebata onyinye mkpụrụ ha nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼefere mmemme dị ọcha. Aga m ahọrọkwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị,” ka Onyenwe anyị kwuru.

“Dịka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ahụ nke m ga-eke ga-esi dịgide nʼihu m, otu a ka aha unu na agbụrụ unu ga-adịgide, ka Onyenwe anyị kwubiri. Ọ ga-abụkwa na site nʼotu Ọnwa ọhụrụ ruo nke ọzọ, sitekwa nʼotu ụbọchị izuike ruo na nke ọzọ ya, anụ ahụ niile bụ mmadụ ga-abịa, daa, kpọọ isiala nʼihu m,” ka Onyenwe anyị kwuru. “Ha ga-apụ, jee, lekwasị ozu ndị ahụ niile nwụrụ anwụ anya, bụ ndị ahụ niile nupuru isi megide m. Nʼihi na ikpuru ha agaghị anwụ anwụ, ọkụ a kwanyere agakwaghị anyụ anyụ. Ha ga-abụkwara mmadụ niile ihe na-asọ oyi.”

Source notes (2)
  1. Footnote Ụfọdụ akwụkwọ mgbe ochie na-ede Put ma ndị Hibru na-ede Pul
  2. Footnote Maọbụ, ndị Lud

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.