Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Aịzaya 35

Ọnụ ndị a gbapụtara

Nʼụbọchị ahụ, ọzara na ala kpọrọ nkụ ga-enwe obi ụtọ;

okoko osisi mara mma ga-awapụtakwa nʼọzara.

Dịka rozu, ọ ga-agbawa ifuru jupụta;

ọ ga-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu, tiekwa mkpu ọṅụ.

A ga-enye ya nsọpụrụ nke ugwu Lebanọn,

nyekwa ya ịma mma nke ala ubi Sharọn na Kamel.

Ha ga-ahụ ebube Onyenwe anyị nʼebe ahụ,

ha ga-ahụkwa ịdị ukwuu1 nke Chineke anyị.

Meenụ ka aka ndị ahụ kụdara akụda dịkwa ike,

gbaakwanụ ụkwụ ndị ahụ na-asọ ngọngọ ume.

Gwanụ ndị ahụ na-atụ egwu sị ha,

“Dịrịnụ ike, unu atụla egwu,

nʼihi na Chineke unu na-abịa.

Ọ ga-abịa ịbọtara unu ọbọ,

ịkwụghachi ndị iro unu ihe ruuru ha.

Ọ ga-abịa ịzọpụta unu.”

Mgbe ọ bịara, ọ ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì,

meekwa ka ndị ntị chiri nụ ihe.

Ọ ga-eme ka onye ngwụrọ wulie elu dịka ele,

meekwa ka ndị na-adịghị ekwu okwu tie mkpu ọṅụ.

Mmiri ga-agbawapụta sọọ nʼọzara,

mmiri iyi ga-ejupụtakwa nʼala kpọrọ nkụ.

Elu ala ahụ na-ere ọkụ nʼụkwụ ga-aghọ ọdọ mmiri.

Ala ahụ nke mmiri kọrọ ga-aghọ isi iyi nke mmiri ga-ejupụta.

Ebe ahụ nkịta ọhịa naara ebi ga-aghọ ala mmiri mmiri;

ahịhịa, na ahịhịa riidi, na ahịhịa papịrọs, ga-epupụta nʼime ya.

Okporoụzọ ga-adịkwa nʼebe ahụ,

nke a ga-akpọ, Okporoụzọ Ịdị Nsọ,

Ọ ga-adịrị naanị ndị ahụ na-agbaso Ụzọ ahụ.

Ndị na-adịghị ọcha agaghị eje ije nʼelu ya,

ndị nzuzu ajọ omume2 agaghị ejegharị nʼelu ya.

Ọdụm agaghị anọ nso ụzọ ahụ.

Ọ dịkwaghị anụ ọhịa na-egbu mmadụ ga-aga nʼelu ya.

E, agaghị ahụ anụ dị otu a nʼebe ahụ.

Kama, ọ bụ naanị ndị a gbapụtara ga-eje ije na ya.

Ma ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa.

Ha ga-eji abụ bata na Zayọn;

ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha.

Oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha.

Iru ụjụ na ịsụ ude3 ga-efelaga.

Source notes (3)
  1. Footnote Maọbụ, ịma mma
  2. Footnote Ndị nwere uche gbagọrọ agbagọ
  3. Footnote Ya bụ, ize ume

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.