Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Hosiya 6

Nnọgide na nnupu isi Izrel

“Bịanụ ka anyị laghachikwuru Onyenwe anyị.

Ya onwe ya adọkaala anyị,

ọ ga-agwọkwa anyị;

o tipụla anyị ọnya,

ma ọ ga ekechikwa ọnya anyị.

Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị.

Nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie guzokwa nʼụkwụ anyị,

meekwa ka anyị dịrị ndụ nʼihu ya.

Ka anyị mara Onyenwe anyị;

ka anyị gbalịsie ike ịmata ya.

Ọ bụladị dịka anyanwụ na-awalite,

nʼezie, ọ ga-apụta ìhè dịka chi ọbụbọ,

ọ ga-abịakwute anyị dịka mmiri ozuzo,

dịka mmiri na-ezosa ala nʼoge udu mmiri.”

“Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Ifrem?

Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Juda?

Ịhụnanya gị dịka igwe ojii nke ụtụtụ,

dịka igirigi na-anọ naanị nwa mgbe nta.

Nke mere m ji si nʼọnụ ndị amụma gbukasịa ha.

Ejirila m okwu ọnụ m gbuo ha,

ikpe ọmụma m na-achawapụta dịka ìhè.

Nʼihi na ana m achọ ebere, ọ bụghị aja,

ịmata Chineke kama aja nsure ọkụ niile.

Ma dịka Adam, ha emebiela ọgbụgba ndụ m;

nʼebe ahụ ka ha nọ gosi ekwesighị ntụkwasị obi ha.

Gilead bụ obodo nke ndị na-eme ajọ ihe,

nke eji nzọ ụkwụ ọbara zọtọsịa.

Dịka ndị na-apụnara mmadụ ihe na-ezo na-eche onye ga-agafe,

otu a ka ndị nchụaja

si egbu ndị mmadụ nʼụzọ Shekem,

leenụ oke ajọ omume ihere dị otu a.

Nʼezie, ahụla m ihe jọgburu onwe ya nʼime Izrel.

Nʼebe ahụ ka Ifrem nọ na-agba akwụna,

emerụọkwala Izrel.

“Ma nye gị onwe gị, Juda,

owuwe ihe ubi nọ na-eche gị.

“Mgbe ọbụla m ga-eweghachi akụnụba ndị m,

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.