Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Ezra 1

Sairọs enyere ndị na-alaghachi aka

Nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs, eze Peshịa, ime ka okwu Onyenwe anyị nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, Onyenwe anyị kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị,

“Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru,

“ ‘Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze1 niile nke dị nʼụwa, o nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda. Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga Jerusalem nke dị na Juda, gaa wuo ụlọnsọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel, bụ Chineke nọ na Jerusalem. Ka Chineke ha nọnyekwara ha. Ma nʼobodo ọbụla ebe ndị fọdụrụ ndụ bi, ka ndị nọ nʼebe ahụ nye ha onyinye ọlaọcha na ọlaedo, na akụ na anụ ụlọ nʼụzọ enyemaka, tinyere onyinye afọ ofufu maka ụlọnsọ ukwu Chineke nke dị na Jerusalem.’ ”

Mgbe ahụ, Chineke tinyere ọchịchọ ịlaghachi Jerusalem2 nʼobi ndịisi ezinaụlọ Juda na Benjamin na ndị nchụaja, na ndị Livayị. Ha kwadokwara ịlaghachi maka ịrụ ọrụ ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ na-atụfughị oge. Ndị Juu bi na gburugburu Peshịa nyere ndị nke na-alaghachi Jerusalem onyinye ihe ọlaọcha na ọlaedo, na anụ ụlọ na ihe ndị ọzọ, na onyinye dị oke ọnụahịa dị iche iche, tinyere onyinye afọ ofufu ha.

Nke ka nke, eze Sairọs chịpụtara ọtụtụ ngwongwo nke ụlọnsọ Onyenwe anyị nke Nebukadneza sitere na Jerusalem bukọrọ gaa debe nʼụlọ chi ya. Sairọs bụ eze Peshịa, chịpụtara ha site nʼaka Mitredat, onye bụ odozi akụ, onye gụrụ ha ọnụ nye Sheshbaza, onye bụ onyeisi ndị Juu ahụ na-alaghachi Jerusalem na Juda.

Nke a bụ ọnụọgụgụ ngwongwo ndị ahụ:

efere ọlaedo iri atọ (30),

efere ọlaọcha otu puku (1,000),

efere ọlaọcha iri abụọ na itoolu (29),

efere nta ọlaedo iri atọ (30),

efere ọlaọcha nta narị anọ na iri (410),

ngwongwo ndị ọzọ otu puku (1,000).

Nʼime ihe ndị a niile, ọnụọgụgụ ihe e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ dị puku ise na narị anọ (5,400).

Sheshbaza bulatara ihe ndị a mgbe ya na ndị ahụ a dọọrọ nʼagha hapụrụ Babilọn na-alọta Jerusalem.

Source notes (2)
  1. Footnote Alaeze Sairọs gbatịrị site nʼIndia jeruo Ijipt, ma sitekwa nʼebe dị warawara nʼosimiri Uhie ruo Kush.
  2. Footnote Nke a bụ ogologo ụzọ dị narị kilomita itoolu maọbụ otu puku. Ọ ga-ewe onye ije ihe dịka ọnwa abụọ, maọbụ atọ iji ụgbọala nke ịnyịnya na-adọkpụ ruo Jerusalem.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.