Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Izikiel 21

Babilọn, mma agha Chineke

Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, “Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ Jerusalem, buo amụma megide ụlọnsọ ukwu ahụ. Bukwaa amụma megide ala Izrel sị ala Izrel otu a, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Mụ onwe m na-emegide gị. Aga m esite nʼọbọ mịpụta mma agha m, site na gị gbuchapụ ma onye ezi omume na onye ajọ omume. Nʼihi na m na-aga igbuchapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume, mma agha m ga-esite nʼọbọ ya pụta megide onye ọbụla site nʼugwu ruo na ndịda. Mgbe ahụ, mmadụ niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị amịpụtala mma agha m site nʼọbọ ya, ọ gaghị amịghachi baa nʼọbọ ọzọ.’

“Nʼihi ya, sụọ ude, nwa nke mmadụ, sụọ ude nʼihu ha nʼọnọdụ oke mwute na obi mgbawa. Mgbe ha jụrụ gị, ‘Gịnị kpatara i ji asụ ude?’ Ị ga-asị, ‘Nʼihi ozi nke na-abịa. Obi niile ga-agbaze site nʼegwu, aka niile ga-akụdakwa; mmụọ niile ga-ada mba,1 ikpere niile ga-ede mmiri site nʼamịrị.’ Ọ na-abịa, ọ ghaghị imezu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”

Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, “Nwa nke mmadụ buo amụma sị, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:

“ ‘Lee, mma agha, lee, mma agha,

a mụọla ya, hichakwaa ya.

Amụọla ya nʼihi oke ogbugbu nke gaje ịdị,

hichakwaa ya nke ọma ka ọ na-egbu dịka amụma.

“ ‘Anyị ọ ga-aṅụrị ọṅụ na mkpara eze nwa m nwoke Juda? Mma agha na-elelị mkpara niile dị otu a anya.

“ ‘E nyere iwu ka e hichazie mma agha ahụ,

ka e jidekwa ya nʼaka.

A mụọla ya, hichazie ya.

E doziela ya maka onye ahụ ga-eji ya laa ndụ nʼiyi.

Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa ma kwasie akwa ike,

nʼihi na ọ bụ megide ndị m

ọ bụkwa megide ndịisi Izrel niile.

A na-atụnyere ha mma agha ga-egbu ha,

ha na ndị m.

Nʼihi ya, tie aka gị nʼobi gị.2

“ ‘Ọnwụnwa aghaghị ịbịa. Ma gịnị ga-eme, ma ọ bụrụ na mkpara eze nke mma agha na-elelị anya, agaghị nʼihu na-adịgide? Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’

“Nʼihi ya, buo amụma, nwa nke mmadụ.

Kụkọọ ọbụ aka gị abụọ,

ka mma agha gbuo ugboro abụọ

e, ọ bụladị ugboro atọ.

Ọ bụ mma agha e debere maka ogbugbu,

nke e debere maka oke ogbugbu

nke ga-abịachibido ha gburugburu.

Ka obi ha gbazee site nʼegwu,

ka ndị na-ada ada hie nne,

nʼihi na edoziela m mma agha ahụ nʼọnụ ụzọ ama ha niile

maka oke ogbugbu.

Lee, mma agha ahụ na-egbu amụma,

etinyela ya nʼaka onye ga-egbu oke ogbugbu.

Gị mma agha, ebe ọbụla ị chọrọ, ebe ọbụla i nwere ike, gbuo onye ọbụla,

ma ọ nọ gị nʼaka nri

ma ọ nọ gị nʼaka ekpe.

Mụ onwe m ga-akụkọtakwa ọbụ aka m,

ime ka iwe m jụrụ.

Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.”

Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, “Nwa nke mmadụ mee ụzọ abụọ nke mma agha eze Babilọn ga-eso. Ka ụzọ abụọ ndị a malite nʼotu obodo. Dee ihe ngosi manye ha nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ. Mee ka otu nʼime ụzọ ndị ahụ bụrụ ebe mma agha ga-esi bịa megide Raba nke Amọn, ka nke ọzọ megide Juda na Jerusalem, bụ ebe e wusiri ike. Nʼihi na eze Babilọn ga-abịa guzo nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ,3 nʼisi ụzọ abụọ ahụ ịchọ ihe ama. Ọ ga-esite nʼịgba àkụ nke ife nza, jụọ ase site nʼaka arụsị ya niile, nyochakwaa umeju ahụ. Nʼụzọ dị nʼaka nri, ka ihe ịjụ ase banyere Jerusalem ga-esi bịa. Nʼebe ahụ ka ọ ga-ewu ihe niile ha ji etida mgbidi obodo ahụ. Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ nye iwu maka igbuchapụ ndị niile, na iwu ido ihe e ji etipu mgbidi nʼọnụ ụzọ ama niile, na iwu a ga-eji wuo nkwasa agha na mgbidi e ji ebuso ya agha. Ọ ga-adị ha dịka ọjụjụ ase nke na-abaghị uru, nye ndị ahụ ṅụrụ ha iyi, ma ọ ga-echetara ha ihe ọjọọ4 ha mere, dọkpụrụ ha nʼike.

“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru. ‘Ebe ọ bụ na unu esitela na nnupu isi unu mee ka e cheta ajọ omume unu, si otu a na-ekpughe mmehie unu nʼihe niile unu na-eme. Ebe ọ bụ na unu emeela ihe dị otu a, a ghaghị ịdọta unu nʼagha.

“ ‘Gị onye rụrụ arụ, onye na-emebi iwu, gị nwa eze nʼIzrel, gị onye ụbọchị ahụhụ ya rurula, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, yipụ okpueze gị, ya na akwa ị na-atụghị nʼisi. Ihe agaghị adịkwa dịka o si adị na mbụ. A ga-ebuli ndị dị ala, wedata ndị dị elu. Mbibi, mbibi. Aga m eme ka ọ ghọọ ihe e bibiri ebibi. A gaghị eweghachikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe onye ahụ o ruuru nʼizi ezi bịara. Ya ka m ga-enyefe ya nʼaka.’

“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, buo amụma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru megide ndị Amọn nʼihi ịkwa emo ha:

“ ‘Lee mma agha, lee mma agha,

nke a mịpụtara maka oke ogbugbu.

E hichaziela ya mee ka ọ dị nkọ iripịa,

ka ọ na-egbu amụma dịka amụma egbe eluigwe.

Nʼagbanyeghị ọhụ ụgha nke a na-ahụ banyere unu,

na a jụtakwala ase ụgha banyere unu,

a ga-etinye ya nʼolu

ndị mmebi iwu ahụ a gaje igbu egbu,

bụ ndị ụbọchị ha rurula,

ndị oge ịta ahụhụ ha zukwara.

“ ‘Mịghachinụ ya nʼọbọ ya.

Nʼebe ahụ e kere unu

nʼala nna nna unu ha,

Aga m ekpe unu ikpe.

Aga m awụkwasị unu ọnụma m,

kukwasịkwa unu ikuku nke oke iwe m.

Aga m ewere unu nyefee nʼaka ndị na-eme ihe ike,

ndị bụ ọka na ịla mmadụ nʼiyi.

Unu ga-aghọkwa mmanụ a na-awụnye nʼọkụ.

A ga-awụsịkwa ọbara unu nʼala unu.

Ọ dịkwaghị onye ga-echeta unu ọzọ,

nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.’ ”

Source notes (4)
  1. Footnote Maọbụ, ike ga-agwụ mmụọ niile
  2. Footnote Maọbụ, tie aka nʼapata ụkwụ gị
  3. Footnote Maọbụ, nʼagbata ụzọ
  4. Footnote Ya bụ, ajọ omume ha

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.