Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Esta 10
Ịdị ukwuu nke Mọdekai
Eze bụ Ahasuerọs na-anakọta ụtụ site nʼaka ndị niile bi nʼalaeze ya tutu ruo nʼọnụ mmiri osimiri ebe alaeze ahụ sọtụrụ. Ma ọrụ ukwu na ọrụ niile ọ rụrụ, ya na ihe niile gbasara ịdị ukwuu nke Mọdekai, na ugwu niile eze nyere ya, ha niile ka e dere nʼime akwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Midia na Peshịa mere nʼoge ọchịchị ha. Mọdekai, onye Juu, bụ onye na-esote eze Ahasuerọs nʼọkwa. Ọ bụ onye dị ukwuu nʼetiti ndị Juu, na onye ndị Juu ibe ya na-asọpụkwara, nʼihi na ọ na-elenye anya nʼihe gbasara udo ndị Juu. Ọ bụkwa onye na-ekwuchite ọnụ nʼihe banyere ọdịmma nke ndị Juu niile.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.