Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Ekiliziastis 11

Ịgbasapụ aka

Gbasapụ aka gị nʼinye onyinye

nʼihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-anata ụgwọ ọrụ gị.

Kee akụ gị ụzọ asaa maọbụ ụzọ asatọ

nʼihi na ị maghị ụdị ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị gị nʼobodo.

Mgbe eluigwe rujiri,

mmiri ga-ezo;

mgbe osisi dara, maọbụ nʼugwu maọbụ na ndịda,

ebe ahụ ka ọ na-atọgbọ.

Onye na-ele ikuku anya agaghị akụ mkpụrụ ọbụla,

onye na-ele igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi.

Dịka mmadụ na-apụghị ịmata ụzọ ikuku si aga

maọbụ otu ndụ ọhụrụ si ebido nʼime afọ nwanyị dị ime,

otu a ka o si dịrị ma mmadụ apụghị ịghọta ọrụ Chineke,

onye mere ihe niile.

Ghaa mkpụrụ gị nʼụtụtụ,

esepụkwala aka nʼanyasị,

nʼihi na ị maghị nke ga-eto,

maọbụ nke a maọbụ nke ọzọ,

ha niile nwere ike too nke ọma.

Cheta Chineke nʼokorobịa gị

Ìhè dị ụtọ,

ọ na-amasịkwa anya ịhụ ìhè anyanwụ.

Ọ bụrụ na mmadụ adị ndụ ọtụtụ afọ,

ya ṅụrịa nʼime ihe niile,

ma ya cheta ụbọchị ọchịchịrị

ga-adị ọtụtụ.

Ihe niile ndị na-abịa bụ ihe efu.

Nwa okorobịa, ọ bụ ihe oke ọṅụ na ị bụ okorobịa.

Ya mere, ka obi gị nye gị ọṅụ nʼụbọchị niile nke okorobịa gị.1

Mee ihe niile ị chọrọ ime;

gbasookwa ihe niile nke anya gị na-ahụ.

Kama, ghọtakwa nke a,

na ị ghaghị ịza ajụjụ nʼihu Chineke nʼihi ihe niile i mere.

Ya mere, wezuga nchegbu site nʼobi,2

wezugakwa nsogbu nke ahụ gị,

nʼihi na okorobịa na ịdị ike bụ ihe efu.

Source notes (2)
  1. Footnote Akw 3:27
  2. Footnote 2Tm 2:22.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.