Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Ekiliziastis 1

Ọ nweghị ihe nwere isi

Okwu onye ozizi, nwa Devid, onye bụ eze na Jerusalem.

Ihe efu, ihe niile bụ ihe efu

ka onye ozizi na-ekwu.

Ihe na-enweghị isi1 ka ihe niile bụ.

Ihe niile bụ nnọọ ihe efu.

Olee uru mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile

ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ?

Otu ọgbọ laa, ọgbọ ọzọ abịa,

ma ụwa na-adịgide ruo ebighị ebi.

Anyanwụ na-awa, na-adakwa,

ma mee ngwangwa laghachi ebe o si awapụta.

Ifufe na-efe gaa na ndịda;

feekwa gburugburu gaa nʼugwu,

ọ na-efegharị gburugburu ebe niile;

na-efe na-enweghịkwa nsọtụ.

Mmiri dị nʼiyi niile na-asọbanye nʼoke osimiri

ma oke osimiri ejughị eju.

Emesịakwa, mmiri ndị a na-alọghachi nʼiyi ndị a,

malitekwa ịsọkwa na-aga nʼosimiri.

Ihe niile nọ na-adọgbu onwe ha nʼọrụ;

ọnụ apụghị ịkọ ụdị ike ọgwụgwụ dịnụ.

Otu ọbụla anyị si lee anya, afọ adịghị eju anya anyị.

Afọ adịghịkwa eju ntị anyị ịnụ ihe, na ige ntị.

Ihe ọbụla nke dịrịla na mbụ ga-adịkwa ọzọ.

Ihe ndị mmadụ mere nʼoge gara aga ka a ga-emekwa ọzọ.

Ọ dịkwaghị ihe ọhụrụ ọbụla dị nʼokpuru anyanwụ.

Ọ dị ihe enwere ike ikwu sị,

“Lee, ihe a bụ ihe ọhụrụ”?

Ọ bụ ihe dịịrị nʼoge gara aga,

nʼoge ndị garalarị tupu oge anyị.

Anaghị echeta ndị mgbe ochie,

otu aka ahụ kwa, ọgbọ na-abịa abịa

ndị ga-eso ha

agakwaghị echeta ha.

Amamihe enweghị isi

Mụ onwe m bụ onye nkuzi, bụrịị eze Izrel nʼime Jerusalem. Ekpebiri m, were onwe m nye, iji amamihe nnyochapụta ihe m nwere ike ịmata banyere ihe niile a na-eme nʼime ụwa. Olee ụdị ibu arọ bụ nke a, nke Chineke bokwasịrị ụmụ mmadụ? Enyochaala m ihe niile a na-eme nʼụwa chọpụta na ha enweghị isi. Ọ dị ka mmadụ ịchụgharị ifufe.

Ihe gbagọrọ agbagọ, apụghị ime ya ka ọ dizie.

Ihe na-ezughị ezu, enweghị ike ịgụta ha ọnụ.

Echere m nʼime obi m sị, “Lee anya! Aghọọla m onye ukwu, bụrụ onye maara ihe karịa ndị eze niile chịrịla na Jerusalem. Enweela m amamihe nʼebe ọ dị ukwu, babigakwa ụba oke nʼihe ọmụma.” Nʼihi ya, agbalịsiri m ike ịmụta ihe dị iche nʼetiti ihe ọmụma, na ịyị ara na nzuzu. Ma ihe m chọpụtara bụ na ọ baghị uru. Ọ dị ka itufu oge ịchọ ụzọ ijide ifufe.

Nʼihi na mgbe amamihe na-aba ụba, mgbe ahụ ka iwe na ọnụma na-ejupụta,

oke ihe ọmụma na-ewetakwa oke ihe mgbu.

Source notes (1)
  1. Footnote Maọbụ, ihe efu Abụ 144:4.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.