Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

2 Samuel 8

Mmeri nʼagha nke Devid meriri

Mgbe ihe ndị a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia. Mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Meteg-Amaa site nʼọchịchị ndị Filistia.

Devid merikwara ndị Moab.1 O mere ka ha dinaa nʼala. O jikwa ụdọ ọtụtụ tụa ha. Ọtụtụ abụọ ọbụla nʼime ha ka egburu. Ọtụtụ nke atọ ka a hapụrụ ka ha dịrị ndụ. Ya mere, ndị Moab ghọrọ ndị ohu Devid, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla.

Devid merikwara Hadadeza nwa Rehob, eze Zoba. Mgbe ọ gara inweghachita ogidi e jiri mara ya, nʼakụkụ osimiri Yufretis. Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya.

Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha. O wuru ogige ndị agha nʼalaeze ndị Aram nke Damaskọs. Ndị Aram ghọrọ ndị ohu Devid, na-ewetakwa ụtụ ịnata ihuọma. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.

Devid chịkọtara ọta ọlaedo ndịisi agha Hadadeza ji lụọ agha webata ha na Jerusalem. Site na Teba2 nakwa Beirotai, bụ obodo Hadadeza na-achị. Eze Devid weere ọtụtụ bronz dị ukwuu.

Mgbe Tou, eze Hamat, nụrụ na Devid emeriela ndị agha Hadadeza niile, o zipụrụ Joram, nwa ya nwoke, ka ọ gaa kelee Devid, nʼihi mmeri o meriri Hadadeza nʼagha, bụ onye ya na Tou nọ nʼagha. Joram ji ọtụtụ akụrụngwa nke ọlaọcha, nke ọlaedo na nke bronz bịa.

Eze Devid doro akụrụngwa ndị a niile nsọ nye Onyenwe anyị, dịka o si mee ọlaọcha na ọlaedo si na mba niile ndị ọ lụgburu. Mba ndị a bụ: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek. O dokwara nsọ nye Onyenwe anyị ihe ọ kwatara nʼagha site nʼaka Hadadeza nwa Rehob, bụ eze Zoba.

Devid meere onwe ya aha, mgbe o si nʼitigbu puku ndị ikom Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu lọghachite.

O wuru ogige ndị agha nʼala Edọm niile, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.

Ndị na-ejere Devid ozi

Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi. O mesokwaghị onye ọbụla mmeso ọjọọ. Onyeisi ndị agha ya bụ Joab3 nwa Zeruaya; ode akwụkwọ obodo bụ Jehoshafat, nwa Ahilud. Zadọk4 nwa Ahitub, na Ahimelek nwa Abịata, bụ ndị nchụaja; Seraya bụ ode akwụkwọ eze. Benaya, nwa Jehoiada, bụ onyeisi ndị Keret na Pelet.5 Ụmụ ndị ikom Devid bụkwa ndị nchụaja.

Source notes (5)
  1. Footnote Ndị Moab bụ ndị agbụrụ Lọt Jen 19:37 , ha bichiri oke ala ndị Izrel nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Nwụrụ anwụ. Sọl lụgburu ha nʼoge gara aga. 1Sa 14:47 Devid zigara ndị ezinaụlọ ya na nke ndị ikwu ya nʼala Moab, mgbe ọ gbara ọsọ ndụ site nʼaka Sọl. 1Sa 22:3-4 Agbụrụ nna nna ochie Devid sitekwara nʼala Moab. Rut 1:22; 4:22
  2. Footnote Ma ọ bụkwanụ, Beta
  3. Footnote Joab bụ nwa nwanne nwanyị Devid.
  4. Footnote Zadọk bụ nwa nwa Elieza, onye nchụaja, 2Ih 24:3 nke nọgidere nʼarụ ọrụ ya nʼikwesị ntụkwasị obi nye Devid. Ọ bụ ya tere Solomọn mmanụ ịbụ eze nʼọnọdụ Devid. 1Ez 1:32-35; 1Ih 23:1; 29:22
  5. Footnote Ndị Keret bụ ndị si obodo Kriit, ebe ndị Pelet si nʼobodo Filistia. Ha bụ ndị agha e goro ego na-eche eze nche, gụọ akwụkwọ 1Ih 18:17

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.