Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Job 4
Okwu Elifaz
Mgbe ahụ, Elifaz onye obodo Teman zara Job sị:
“Iwe ọ ga-ewe gị ma ọ bụrụ na mmadụ agwa gị okwu?
Onye kwanụ nwere ike ịnọ nʼebe a hapụ ikwu okwu?
Lee ka i siri nye ọtụtụ mmadụ ndụmọdụ,
na ka i si mee ka ndị na-ada mba nwee ume.
Okwu ọnụ gị abụrụla ihe ịgbaume nye ọtụtụ mmadụ,
ị bụrụla ịgbaume nye ndị ikpere ha na-ama jijiji.
Ma leenụ ugbu a, nsogbu abịakwasịla gị, ị bụrụla onye na-ada mba;
nsogbu etiela gị aka, i na-ama jijiji.
Egwu ị na-atụ Chineke ọ gaghị abụ ihe ịgbaume nye gị,
izi ezi nke ndụ gị abụrụkwa olileanya gị?
“Chee echiche ugbu a! Onye, bụ onye aka ya dị ọcha, nke a larala nʼiyi?
Ebee ka i hụrụ ka e bibiri ndị na-eme ihe ziri ezi?
Dịka m si hụ ya, ndị na-agha ajọ ihe dịka mkpụrụ na ndị na-akụ okwu na ụka
na-aghọta ya dịka ihe ubi.
Chineke na-ala ha nʼiyi site nʼume ọ na-ekupụta.
Ọ na-esitekwa nʼoke iwe ya repịa ha.
Ọdụm nwere ike gbọọ ụja, maọbụ bigbọọ,
ma eze ọdụm dị ike ka a gbajisiri.
Oke ọdụm na-ala nʼiyi site na-enweghị ihe ọ dọgbutara,
ụmụ nne ọdụm niile ka a na-achụsa.
“E mere ka okwu rute m nʼụzọ nzuzo,
ntị m nụrụ ya nʼịgba izu.
Nʼime nkụja nke oke nrọ nke abalị,
mgbe oke ụra na-adakwasị ụmụ mmadụ,
oke ụjọ na ahụ ịma jijiji dakwasịrị m,
meekwa ka ọkpụkpụ niile dị nʼahụ m maa jijiji.
Otu mmụọ sitere nʼihu m gafee.
Ọ bụladị ajị dị m nʼahụ guzochara ọtọ nʼihi ụjọ.
Ọ kwụsịrị;
ma apụghị m ịkọ ihe ọ bụ.
Onyinyo guzooro nʼanya m,
anụrụ m olu dị nro, nke kwuru sị:
‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke?
Ọ bụladị nwoke dị ike, ọ pụrụ ịdị ọcha nʼobi karịa Onye kere ya?
Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi,
ọ bụrụ na ọ na-ebo ndị mmụọ ozi ya ebubo imejọ ihe,
ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa,
bụ ndị ntọala ha dị nʼaja,
ndị nke a na-azọpịa ngwangwa dịka nla.
Site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, a na-etipịasị ha:
ha na-ala nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi, ihe niile a na-agakwa dịka o si aga.
Ọ bụ na-eholiteghị eriri ụlọ ikwu ha elu,
mee ka ha nwụọ na-enweghị amamihe?’
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.