Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Nehum 2

Ninive ga-ada

Onye na-ebuso gị agha na-abịakwasị gị.

Chee ebe gị niile e wusiri ike nche.

Chee ụzọ niile nche,

mee ka ụkwụ gị sie ike nʼala.

Chịkọtakwa ike gị niile.

Onyenwe anyị ga-eme ka ịma mma Jekọb laghachi,

dịka ịma mma nke Izrel

ọ bụ ezie na ndị mbibi ebibiela ha,

lakwaa alaka osisi vaịnị ha niile nʼiyi.

Ọta ndị agha ya na-acha ọbara ọbara,

ndị bụ dike nʼagha yikwa uwe na-acha uhie uhie.

Igwe e ji wuo ụgbọ agha na-egbu amụma

nʼụbọchị ahụ ha na-ejikere agha,

otu a kwa, ha na-efegharịkwa ùbe ha eji osisi fịa mee.

Ụgbọ agha na-eme mkpọtụ dị ukwuu nʼezi,

ha na-agbagharị ihu na azụ nʼama niile.

Ha na-enwu dịka ire ọkụ,

na-agbagharịkwa dịka amụma.

Ọ na-akpọkọta ndị agha ya a zụziri azụzi,

ma ha na-asọ ngọngọ nʼije ha.

Ha ji ọsọ gbaga ruo nʼelu mgbidi ha,

dozie ọta nche ha niile nʼusoro.

Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri,

ụlọeze na-amakwa jijiji.

E nyela ya ka ọ bụrụ iwu na obodo a

aghaghị ịbụ obodo a dọtara nʼagha.

Ndị ohu ha ndị inyom so ha nʼazụ na-akwa akwa dịka nduru,

na-etikwa aka nʼobi.

Ninive dịka ọdọ mmiri

nke mmiri ya na-ehifusị.

“Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe,

ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ.

Kwakọrọnụ ọlaọcha,

kwakọrọnụ ọlaedo dịka ihe a kwatara nʼagha.

Akụnụba dị nʼụlọakụ ya na ihe ndị ọzọ bara uru nʼobodo ahụ,

enweghị ọgwụgwụ.

E bibiela ya. A gbahapụla ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu.

Obi ndị nọ nʼime ya na-alọ mmiri, ikpere ha niile na-ama jijiji,

anụ ahụ ha niile na-amakwa jijiji, ihu niile achagharịakwala.

Ebeekwa ka ọgba ọdụm ahụ dị ugbu a,

bụ ebe ahụ ha na-anọ enye ụmụ ha nri,

ebe oke ọdụm na nne ọdụm na-ejegharị,

na ebe ụmụ ọdụm na-anọ na-atụghị egwu ihe ọbụla?

Ọdụm ahụ na-adọgbu anụ na-ezuru ụmụ ya,

nke na-anyagburu nne ọdụm anụ,

na-ekpoju anụ ọ dọgbutara nʼụlọ ya niile.

Ebe obibi ya jupụtara nʼanụ ọ dọgburu.

“Edoola m onwe m imegide gị,”

otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri,

“Aga m esure ụgbọala gị niile nʼanwụrụ ọkụ,

mma agha ga-ala ụmụ ọdụm gị niile nʼiyi.

Agaghị m ahapụkwara gị anụ ọbụla ị ga-adọgbu nʼụwa.

A gaghị anụkwa

olu ndị ozi gị ọzọ.”

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.