Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Matiu 1

Usoro ọmụmụ Jisọs onye bụ Kraịst ahụ

Nke a bụ ndekọ usoro ọmụmụ Jisọs onye bụ Kraịst, nwa Devid, nwa Ebraham.

Ebraham mụrụ Aịzik,

Aịzik amụọ Jekọb,

Jekọb amụọ Juda na ụmụnne ya.

Juda mụtara Perez na Zera site na Tama,

Perez mụrụ Hezrọn,

Hezrọn amụọ Aram.

Aram mụrụ Aminadab,

Aminadab mụrụ Nashọn,

Nashọn amụọ Salmọn.

Salmọn bụ nna Boaz, site na nwunye ya Rehab,

Boaz mụrụ Obed, site na nwunye ya Rut,

Obed amụọ Jesi.

Jesi amụọ Devid, bụ eze.

Devid mụrụ Solomọn site na nwunye ya Ụraya.

Solomọn mụrụ Rehoboam,

Rehoboam amụọ Abija,

Abija amụọ Esa.

Esa mụrụ Jehoshafat,

Jehoshafat amụọ Joram,

Joram amụọ Ụzaịa.

Ụzaịa mụrụ Jotam,

Jọtam amụọ Ehaz,

Ehaz amụọ Hezekaya.

Hezekaya mụrụ Manase,

Manase amụọ Emọn,

Emọn amụọ Josaya.

Mgbe e mere ka ha gaa biri nʼala Babilọn ka Josaya mụrụ Jekonaya na ụmụnne ya.

Mgbe ha si Babilọn lọta

Jekonaya mụrụ Shealtiel,

Shealtiel amụọ Zerubabel.

Zerubabel mụrụ Abiud,

Abiud amụọ Eliakịm,

Eliakịm amụọ Azoa.

Azoa mụrụ Zadọk,

Zadọk amụọ Akịm,

Akịm amụọ Eliud.

Eliud mụrụ Elieza,

Elieza amụọ Matan,

Matan amụọ Jekọb.

Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst.

Ya mere, site nʼEbraham ruo na Devid, e nwere ọgbọ iri na anọ. Ma site nʼoge Devid ruo mgbe a dọọrọ ha nʼagha gaa Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nʼoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Kraịst bụkwa ọgbọ iri na anọ.

Josef anabata Jisọs dịka nwa ya nwoke

Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst1 siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ. Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo.

Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ. Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs,2 nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha.”

Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị, “Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel”3 (nke bụ ma asụgharịa ya, “Chineke nọnyeere anyị”).

Mgbe Josef si nʼụra teta, o mere dịka mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye ya. Ma ha abụọ edinakọghị tutu ruo mgbe ọ mụsịrị nwa nwoke, onye ọ kpọrọ aha ya Jisọs.

Source notes (3)
  1. Footnote Maọbụ, Onye nzọpụta
  2. Footnote Jisọs nke a bụ otu ndị Griik si akpọ Joshua nke pụtara Onyenwe anyị na-azọpụta.
  3. Footnote Aịz 7:14

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.