Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Luk 3
Nkwusa nke Jọn omee baptizim
Nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị Tiberiọs Siza, mgbe Pọntiọs Pailet bụ onye na-achị Judịa, ebe Herọd bụkwa onye na-achị akụkụ Galili, ma nwanne ya nwoke bụ Filip na-achị akụkụ Iturịa na Trakona, Laisania bụkwa onye na-achị akụkụ Abilin, mgbe ahụ Anas na Kaịfas bụ ndịisi nchụaja, okwu Chineke bịakwutere Jọn nwa Zekaraya nʼime ọzara. Ọ gara nʼime obodo niile gbara Jọdan gburugburu na-ekwusa banyere baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie. Dịka e dere ya nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị,
“Otu onye na-eti mkpu nʼọzara na-asị,
‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị,
meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.
A ga-ekpoju ndagwurugwu ọbụla,
ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala.
Ụzọ gbagọrọ agbagọ ka a ga-eme ka o guzozie nke ọma,
meekwa ka ụzọ ọjọọ niile dị larịị.
Mmadụ niile ga-ahụkwa nzọpụta Chineke.’ ”1
Jọn sịrị igwe mmadụ ndị na-apụta ka o mee ha baptizim sị, “Unu ụmụ ajụala! Onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa? Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu. Unu amalitekwala na-asị onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna.’ Nʼihi na agwa m unu na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ. Ọ bụladị ugbu a, atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi, osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu tụba ya nʼime ọkụ.”
Ma igwe mmadụ ahụ jụrụ ya sị, “Gịnị ka anyị kwesiri ime?”
Ọ zara ha sị, “Onye ọbụla nwere uwe abụọ, ya nye onye ọ na-adịghị nke o nwere otu. Onye nwere nri ya meekwa otu ahụ.”
Ọ bụladị ndị ọna ụtụ bịakwara ka e mee ha baptizim. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, gịnị ka anyị kwesiri ime?”
Ọ sịrị ha, “Unu anatala karịa otu unu kwesiri ịnata.”
Ndị agha bịakwara jụọ ya sị, “Gịnịkwa ka anyị kwesiri ime?”
Ọ sịrị ha, “Unu ejikwala ike apụnara ndị mmadụ ego ha; unu ebokwala ndị mmadụ ebubo ụgha, ka afọ ju unu nʼụgwọ a na-akwụ unu.”
Ndị mmadụ ji olileanya na-eche na-atulekwa nʼobi ha ma Jọn ọ bụ Kraịst ahụ. Ma Jọn zara sị ha, “Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma otu onye dị ike karịa m ga-abịa, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim. Ihe ịfụcha ọka ya dị nʼaka ya, iji zachaa ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, ka e kponye ezi mkpụrụ ọka wiiti nʼime ọba, ma kpoba igbugbo ọka nʼime ọkụ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.” O ji ọtụtụ okwu ọzọ dị iche iche dụọ ha ọdụ ma kwusaakwara ha oziọma.
Ma Eze Herọd, onye ọ tara ụta maka Herodịas nwunye nwanne ya nwoke, nakwa maka ihe ọjọọ dị iche iche ndị o mere, tụkwasịkwara ihe nʼelu ihe ndị a niile, site na ịtụnye Jọn nʼụlọ mkpọrọ.
Baptizim na usoro ndị agbụrụ Jisọs
Mgbe e mechara ndị niile baptizim, ma mechakwa Jisọs baptizim, mgbe ọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere. Mmụọ Nsọ sikwa nʼelu rịdata dị ka nduru, bekwasị ya, mgbe ahụ, otu olu sitere nʼeluigwe daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”
Jisọs agbaala ihe dị ka iri afọ atọ mgbe o bidoro ọrụ ya. Ọ bụ nwa (dịka ndị mmadụ chere) Josef,
onye bụ nwa Heli; Heli abụrụ nwa Matat,
nwa Livayị, nwa Meliki,
nwa Janayi, nwa Josef;
nwa Matatiyas, nwa Emọs,
nwa Nehum, nwa Esili,
nwa Nagayị; nwa Maat,
nwa Matatiyas, nwa Semein,
nwa Josek, nwa Joda;
nwa Joanan, nwa Resa,
nwa Zerubabel, nwa Shealtiel,
nwa Neri; nwa Meliki,
nwa Adi, nwa Kosam,
nwa Elmadam, nwa Er,
nwa Joshua, nwa Elieza,
nwa Jorim, nwa Matat,
nwa Livayị; nwa Simiọn,
nwa Juda, nwa Josef,
nwa Jonam, nwa Eliakịm;
nwa Melea, nwa Mena,
nwa Matata, nwa Netan,
nwa Devid; nwa Jesi,
nwa Obed, nwa Boaz,
nwa Salmọn, nwa Nashọn;
nwa Aminadab, nwa Ram,2
nwa Hezrọn, nwa Perez,
nwa Juda; nwa Jekọb,
nwa Aịzik, nwa Ebraham,
nwa Tera, nwa Nahọ;
nwa Serug, nwa Reu,
nwa Peleg, nwa Eba,
nwa Shela; nwa Kenan,
nwa Aafaksad, nwa Shem,
nwa Noa, nwa Lamek;
nwa Metusela, nwa Enọk,
nwa Jared, nwa Mahalalel,
nwa Kenan; nwa Enọsh,
nwa Set, nwa Adam,
nwa Chineke.
Source notes (2)
- Footnote Aịz 40:3-5
- Footnote Nʼakwụkwọ ụfọdụ i nwere ike ihu nwa Admin, nwa Anai.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.