Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Jona 2

Mgbe ahụ, Jona sitere nʼafọ azụ ahụ kpeere Onyenwe anyị Chineke ekpere. Ọ sịrị,

“Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị,

ọ zakwara m.

Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị,

ị nụkwara olu akwa m.

Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi,

nʼetiti oke osimiri.

Osimiri dịkwa m gburugburu,

ebili mmiri gị na mmali mmiri gị

gabigakwara m nʼisi.

Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gị

chụpụ m;

ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ

nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’

Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m,

ogbu mmiri na-erikpu m.

Achara mmiri kekụkwara m nʼisi.

Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri,

ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi.

Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ,

Onyenwe anyị, bụ Chineke m.

“Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike,

e chetara m gị Onyenwe anyị,

ma ekpere m bịakwutere gị,

nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ.

“Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara,

na-agbakụta ebere Chineke azụ.

Ma ọ bụ olu abụ ekele

ka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja.

Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere.

Nʼihi na ‘Nzọpụta bụ nke Onyenwe anyị.’ ”

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka ọ gbọpụta Jona nʼala akọrọ.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.