Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Job 39

“Ị maara mgbe ewu ọhịa bi nʼelu ugwu ji amụ nwa?

O nweela mgbe ị ji hụ nne ele ka ọ na-amụpụta nwa ya?

Ị na-agụkọ ọnwa ole afọ ime ha na-adị tupu ha amụọ nwa ha.

Ị maara oge ha na-amụ ụmụ ha?

Ha na-amakpuru ala mụpụta nwa ha.

Ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ha ebiekwa.

Ụmụ ha na-eto nʼọhịa gbasiekwa ike.

Ha na-apụ, ha adịghị alaghachikwute ha ọzọ.

“Onye na-eme ka ịnyịnya ibu ọhịa nwere onwe ya?

Onye na-atọpụ agbụ e kere ya?

Nke m nyere ala ihe na-adịghị ka ọ bụrụ ebe obibi ha,

ala nnu ahụ ka ọ bụrụ ụlọ ha.

Ụzụ dị nʼobodo adịghị emetụta ya,

ọ naghị anụkwa mbigbọ nke onye na-achị ya.

Elu ugwu niile bụ ebe ịkpa nri ya,

ebe ahụ ka ọ na-achọpụta ahịhịa ndụ ọbụla.

“Ị nwere ike ime ka atụ jeere gị ozi?

Ị nwere ike ime ka ọ nọdụ nʼabalị nʼụlọ ebe ị na-azụ anụ ụlọ gị nri?

Ị nwere ike ime ka atụ rụọra gị ọrụ nʼubi gị?

Ọ ga-akpụgharịrị gị ọgụ ị ji akọ ala?

Ị ga-atụkwasị ya obi nʼihi na ike ya hiri nne?

Ị ga-ahapụrụ ya ọrụ ndị ahụ siri ike ka ọ rụọ?

I nwere ike ịtụkwasị ya obi ka o gaa bulatara gị ọka

site nʼebe ịzọcha ọka gị?

“Enyi nnụnụ na-eji ọṅụ gbasapụ nku ya,

ma a pụghị iji nku ya tụnyere

nku na abụba nke ụgbala.

Ọ na-eyi akwa ya nʼala

ma hapụ ha ka uzuzu kpoo ha ọkụ.

Ọ naghị emetụ ya nʼobi na ụkwụ nwere ike ịzọpịa ha

maọbụ na anụ ọhịa nwere ike zọrie ha.

Ọ na-emeso ụmụ ya ihe ike dịka a ga-asị na ha abụghị nke ya,

ọ dịghị emetụta ya na ndọgbu nʼọrụ ya nwere ike i bụ nʼefu, ma ọ dịghị atụ egwu.

Nʼihi na Chineke ekenyeghị ya amamihe

maọbụ kenye ya oke na inwe uche.

Ma ọ na-agbalite ọsọ. Mgbe ọbụla ọ gbasara nku ya ịgba ọsọ,

ọ na-achị ịnyịnya na onye na-agba ịnyịnya ọchị.

“Ọ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya,

ka ọ bụ gị mere ka ajị ogologo ahụ o nwere dịrị nʼolu ya?

Ị na-eme ya ka ọ wụgharịa dịka igurube,

were ebube1 nke ịmapụ imi ya na-eyinye ihe oke egwu?

Ọ na-azọ ụkwụ gam gam nʼala, ọ na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ike ya,

ọ na-apụ izute agha na-atụghị egwu.

Ọ na-achị ihe egwu ọchị, ụjọ ọbụla anaghị atụ ya;

ọ naghị esi na mma agha wezuga onwe ya.

Akpa àkụ na-ayọgharị nʼakụkụ ya,

ya na ùbe na arụa na-egbu maramara.

Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eripịa ala.

Mgbe ọ nụrụ ụda opi ike, ọ naghị eguzo otu ebe.

Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eti mkpu sị, ‘Ahaa!’

Site nʼebe dị anya ka ọ na-anụ isisi agha.

Ọ na-aṅụrịkwa ọṅụ maka iti mkpu nke ndị ọchịagha nʼoge agha.

“Ọ bụ site nʼamamihe gị ka egbe ji efego nʼelu,

gbasaakwa nku ya gaa nʼebe ndịda?

Ọ bụ gị nyere ugo iwu ifeli elu

ma wuo akwụ ya nʼebe dị elu?

Nʼelu nkume dị elu ka ọ na-ebi nọọkwa ọnọdụ abalị;

ọwara nkume dị elu bụ ebe e wusiri ike ya.

O bụ site nʼebe ahụ

ka ọ na-esi enyochapụta ihe ọ ga-eburu.

Ụmụ ya na-amịchakwa ọbara,

nʼihi na ebe ọ na-aga bụ ebe ọbụla ọ ga-ahụ ihe e gburu egbu.”

Source notes (1)
  1. Footnote Maọbụ, nganga

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.