Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Aịzaya 9

A mụụrụ anyị otu nwa

Ma otu ọbụla o siri dị, oge ahụhụ na ọchịchịrị na iru ụjụ ahụ agaghị adịgide nye ndị ahụ nọ na nkpa. Nʼihi na nʼoge gara aga, o mere ka e lelịa ala Zebụlọn na ala Naftalị anya, ma nʼoge dị nʼihu, ọ ga-eme ka a asọpụrụ Galili nke mba niile, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan.

Ndị nọ na-agagharị nʼọchịchịrị

ahụla ìhè dị ukwuu;

ndị ahụ bi nʼala nke onyinyo ọnwụ

ka ìhè nwukwasịrị.

I meela ka mba ahụ baa ụba dịrị ukwuu,

mee ka ọṅụ ha dịkwa ukwuu,

ha na-enwe ọṅụ nʼihu gị,

dịka ọṅụ nke ndị ọrụ ubi nʼoge owuwe ihe ubi,

dịka ndị agha na-etegharị egwu ọṅụ

mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara nʼagha.1

Nʼihi na dịka nʼụbọchị nke Midia,

i gbajisiela

ibu arọ niile e bokwasịrị ha,

ihe mgbochi nke dị nʼubu ha,

nke bụ mkpara ndị na-akpagbu ha.

Nʼihi na akpụkpọụkwụ nke ndị agha na-eyi,

na uwe agha nke ọbara mechuru,

ha ga-abụ ihe a ga-agba ọkụ,

ha ga-abụ ihe ndị ga-eme ka ọkụ ree nke ọma.

Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa,

e nyekwala anyị otu nwa nwoke.

Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị.

Ndị a ga-abụ aha ya,

Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike,

Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo.

Alaeze2 ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo

nke na-enweghị ọgwụgwụ.

Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị,

chịakwa nʼalaeze ya.

Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike;

ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịa

site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi.

Ịnụ ọkụ nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,

ga-emezukwa nke a.

Iwe Onyenwe anyị megide Izrel

Onyenwe anyị eziela ozi megide Jekọb

ọ ga-adakwasịkwa Izrel.

Ndị ahụ niile ga-amatakwa ya,

Ifrem na ndị bi na Sameria ga-amatakwa

bụ ndị na-eji nganga

na mpako na-ekwu sị,

“Nkume brik ndị ahụ adakpọsịala

ma anyị ga-eji nkume a waziri awazi wughachi ha;

ọ bụ ezie na e gbutusịala osisi sikamọ niile anyị ji wuo ụlọ anyị,

ma anyị ga-eji osisi ọma sida dochie ha.”

Ma Onyenwe anyị a kpaliela ndị iro Rezin3 ka ha bilie megide ha,

ọ kwaliekwala ndị iro ha.

Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụ

ha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel.

Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,

aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

Ma ọ bụ ezie na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ataala ha ahụhụ dị otu a,

ndị Izrel echegharibeghị, ha alọghachikwutebeghị ya.

Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, Onyenwe anyị ga-ebibi ndịisi Izrel na ndị ọdụdụ,

ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile.

Ndị okenye na ndị a maara aha ha bụ ndịisi ha,

ndị amụma ụgha bụ ọdụdụ ha.

Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha;

ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo.

Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ,

ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ,

nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ Chineke, bụrụkwa ndị ajọ omume,

ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu.

Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,

aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ:

ọ na-erepịa ogwu na uke,

ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ,

mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe.

Nʼihi iwe ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe,

ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere;

ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya;

ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya.

Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe,

onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri.

Ha ga-eri

ma afọ agaghị eju ha;

nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha.

Ndị Manase ga-alụso ndị Ifrem ọgụ, ndị Ifrem ga-alụsokwa ndị Manase ọgụ.

Ha abụọ kwa ga-ejikọta aka lụso Juda ọgụ.

Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ.

Aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

Source notes (3)
  1. Footnote Nke a bụ banyere mmeri Gidiọn meriri ndị Midia Nkp 7; 8:1-21
  2. Footnote Mgbe a kpọrọ Jekọb, maọbụ Izrel, maọbụ Ifrem na Sameria, ha niile dịnyere otu alaeze. Alaeze dị nʼakụkụ ugwu obodo ahụ nke isi obodo ya bụ Sameria.
  3. Footnote Ndị iro Rezin bụ ndị Siria, Filistia, Tiglat-Pilesa na ndị agha ya so buso Izrel agha.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.