Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Aịzaya 64
Ọ gaara adị mma ma asị na ị ga-adọwa eluigwe rịdata nʼala,
ma asị nʼugwu ukwu niile ga-ama jijiji nʼihu gị!
Dịka mgbe ọkụ na-agba ụmụ osisi,
na-eme ka mmiri e sikwasịrị nʼọkụ gbọọ.
Si nʼelu rịdata bịa mee ka ndị iro1 gị niile maara aha gị,
meekwa ka mba niile dị iche iche maa jijiji nʼihu gị.
Nʼihi na ọ bụ mgbe i mere ọtụtụ ihe egwu dị iche iche nke anyị na-atụghị anya ya
ka ị rịdatara mee ka ugwu ukwu niile maa jijiji nʼihu gị.
Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ,
ọ dịbeghị ntị ghọtara,
o nwebeghị anya hụrụ Chineke ọzọ karịa gị,
onye na-emejupụtara ndị na-echere ya ihe na-akpa ha.
Ị na-enyere ndị na-eme ezi ihe aka,
bụ ndị ji ọṅụ na-echeta ụzọ gị nʼechiche uche ha.
Ma mgbe anyị nọgidere na-emehie megide ha,
iwe were gị.
A ga-esikwanụ aṅaa zọpụta anyị?
Anyị niile dịka onye rụrụ arụ,
ezi omume anyị niile kwa dịka nkịrịnka akwa ruru unyi.
Anyị akpọnwụọla dịka akwụkwọ osisi,
mmehie anyị na-ebufukwa anyị dịka ifufe.
Ọ dịghị onye nʼime anyị na-arịọ gị arịrịọ;
ọ dịkwaghị onye na-akpọku aha gị.
Nʼihi ya, i zoola ihu gị site nʼebe anyị nọ,
meekwa ka anyị bụrụ ndị gbazere agbaze nʼihi mmehie anyị.
Ma otu ọbụla o si dị, gị Onyenwe anyị bụ Nna anyị.
Anyị bụ ụrọ, ma ị bụ ọkpụ ite.
Ọ bụ aka gị kpụrụ anyị niile.
Biko, Onyenwe anyị, anọgidela na-eweso anyị iwe;
echetakwala mmehie anyị ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.
Biko, lekwasị anyị anya
nʼihi na ndị gị ka anyị bụ.
Obodo nsọ gị niile aghọọla ọzara;
ọ bụladị Zayọn aghọọla ọzara, Jerusalem, ebe tọgbọrọ nʼefu.
Ụlọnsọ ukwu anyị ahụ mara mma, nke dịkwa nsọ, ebe nna anyị ha nọ too gị, ma feekwa gị ofufe,
abụrụla ihe a gbara ọkụ.
Ihe niile mara mma nʼime ya alaala nʼiyi.
Mgbe ihe niile gasịrị, Onyenwe anyị, ị ga-ejisi onwe gị ike?
Ị ga-agba nkịtị, taa anyị ahụhụ ebe ọ gafere oke?
Source notes (1)
- Footnote Ya bụ, ndị na-emegide gị
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.