Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Aịzaya 57

Ndị ezi omume na-ala nʼiyi,

ma ọ dịghị onye ọbụla na-etinye ya nʼobi;

a na-ewezuga ndị ji obi ha niile na-efe Chineke,

ma ọ dịghị onye na-aghọta,

na-ewezugara onye ezi omume

pụọ nʼihu ihe ọjọọ.

Ndị na-agazi agazi nʼụzọ ha

na-abanye nʼudo.

Ha na-enwekwa izuike mgbe ha dinara nʼọnwụ.

“Ma unu onwe unu, bịanụ nʼebe a, unu ụmụ ndị mgbaasị,

unu ụmụ ndị na-akwa iko, na ụmụ ndị akwụna.

Onye ka unu na-akwa emo?

Onye ka unu na-akọcha,

na-arapụtakwara ire unu?

Unu ọ bụghị ụmụ ndị nnupu isi,

mkpụrụ ndị na-ekwu okwu ụgha?

Unu na-emejupụta ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu agụụ

mgbe unu zukọrọ na-efe arụsị unu nʼokpuru osisi ook ọbụla.

Unu na-ewerekwa ụmụ unu chụọ aja

na ndagwurugwu niile, na nʼokpuru nkume niile dị elu.

Chi unu na-efe bụ nkume niile na-akwọ mụrụmụrụ,1

nke dị na ndagwurugwu niile, ha bụ ihe nketa nza unu fere.

E, ọ bụ ha ka unu na-awụpụrụ onyinye mmanya unu niile

na onyinye mkpụrụ ọka unu niile.

Nʼihi ihe ndị a niile, m ga-esi aṅaa dere duu?

Ọ bụ nʼelu ugwu dị elu ka unu doziiri onwe unu ihe ndina,

nʼebe ahụ kwa ka unu gara chụọ aja unu.

Ọ bụkwa nʼazụ ọnụ ụzọ niile, na ibo ụzọ niile,

ka ị kwụbara oyiyi arụsị gị.

Ị gbakụtara m azụ,

yipụ uwe gị rịbanye nʼime ihe ndina gị,

ebe gị na ndị ahụ ị hụrụ nʼanya dinakọrọ,

imejupụta ihe ọjọọ ahụ na-agụ obi gị agụụ.

Ị were mmanụ jekwuru Molek2

meekwa ka mmanụ otite gị na-esi isi ụtọ baa ụba.

Ị zipụrụ ndị nnọchite anya gị3 gaa na mba dị anya;

ị gbadara ruo nʼime ime ala mmụọ.

Oke mwagharị ndị a niile emeela ike gwụsịa gị,

ma ị dịghị asị, ‘Olileanya adịghị.’

Ị chọtara ntute nye ndụ gị,

ya mere, na ị daghị mba.

“Onye na-emenye gị ụjọ na egwu dị otu a?

Nke mere na ị dịghị agwa m eziokwu?

Ị naghị echetakwa m,

ị naghị atụgharịkwa ihe banyere m nʼobi gị?

Ọ bụ nʼihi na m gbara nkịtị oge ndị a niile

ka i ji hapụ ịtụ m egwu?

Lee, aga m ekpughe ezi omume gị na ọrụ ọma gị,

igosi gị na ihe ndị a ị gụrụ dị ka ezi ihe agaghị enyere gị aka.

Mgbe ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka,

ka arụsị niile ndị ịchịkọbara zọpụta gị.

Ikuku ga-eburu ha niile bufuo,

naanị otu nkuume ga-ekutu ha.

Ma onye ọbụla gbabara nʼime m izere ndụ

ga-eketa ala ahụ;

ha ga-enwetakwa ugwu nsọ m.”

Nkasiobi dịrị ndị dị umeala nʼobi

A ga-asịkwa,

“Dozienụ ụzọ! Dozienụ ụzọ, mee ya ka ọ maa mma.

Bupụsịanụ ihe ịsọ ngọngọ niile nʼụzọ ndị m.”

Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu,

onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru:

“Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ,

ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala,

itute mmụọ nke onye e wedara nʼala,

na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi.

Nʼihi na ọ bụghị ruo ebighị ebi ka m ga na-emegide gị,

maọbụ na-egosi iwe m.

Ọ bụrụ na m emee otu a, mmụọ ndị mmadụ ụwa niile ga-ada mba,

ya na mkpụrụobi niile ahụ m ji aka m kpụọ.

Ewesoro m ha iwe nʼihi mmehie ha na oke ọchịchọ ha.

Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ji taa ha ahụhụ, gbakụtakwa ha azụ.

Ma lee, ha nọgidesikwara ike na-eme mmehie, na-eme ihe ọbụla nke na-atọ obi ha ụtọ.

Ahụla m ihe niile ha mere ma aga m agwọ ha.

Aga m edu ha, kasịekwa ndị na-eru ụjụ nʼIzrel obi.

Aga m eme ka abụ otuto dị nʼegbugbere ọnụ ha.

Udo, udo, dịrị ndị nọ nso na ndị nọ nʼebe dị anya,”

ka Onyenwe anyị kwuru.

“Aga m agwọkwa ha.”

Ma ndị niile na-emebi iwu dị ka oke osimiri na-amagharị amagharị,

nke na-adịghị ezu ike mgbe ọbụla.

Ọ na-amapụtakwa ụrọ na apịtị.

“Ọ dịkwaghị udo dịrị onye na-emebi iwu,” ka Chineke kwuru.

Source notes (3)
  1. Footnote Nkume ndị a na-akwọ mụrụmụrụ bụ ihe ha ji ejere chi ndị ahụ na-abụghị chi ozi.
  2. Footnote Maọbụ, eze
  3. Footnote Ya bụ, arụsị apịrị apị

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.