Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Aịzaya 53

Onye kweere ozi anyị,

ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?

Nʼihi na o tolitere nʼihu Onyenwe anyị dịka ome,

dịka mgbọrọgwụ nke puputara nʼala kpọrọ nkụ.

O nweghị ụdịdị ọma maọbụ ịma mma nke ga-eme ka anyị lee ya anya.

O nweghị ihe ọbụla dị nʼụdịdị ya nke ga-eme ka ihe banyere ya masị anyị, maọbụ mee ka anyị chọsie ya ike.

Ndị mmadụ ledara ya anya, jụkwa ya.

Ọ bụ onye nwere ọtụtụ ihe mgbu, bụrụkwa onye hụrụ ọtụtụ ahụhụ.

Ma anyị gbakụtara ya azụ, jụ ilenye anya nʼebe ọ nọ.

E, anyị ledara ya anya, jụ ịgụ ya dịka ọ bụ ihe ọbụla.

Nʼezie, ihe mgbu niile anyị ka o buuru,

burukwa ahụhụ nke ọrịa anyị niile,

ma anyị gụrụ ya ka onye Chineke tara ahụhụ,

onye o tiri ihe otiti, na onye o mekpara ahụ.

Ma e tipụrụ ya ọnya nʼihi mmehie anyị:

ọ bụkwa nʼihi ajọ omume anyị ka e ji merụchaa ya ahụ.

E mere ka anyị nwee udo nʼihi ahụhụ ọ hụrụ;

ọ bụkwa ubiri ụtarị dị ya nʼahụ mere anyị ji bụrụ ndị ahụ dị ike.

Anyị niile akpafuola dịka igwe atụrụ;

onye ọbụla nʼime anyị etinyela isi ya nʼụzọ nke aka ya.

Ma Onyenwe anyị ebokwasịla ya

ajọ omume anyị niile.

A kpagburu ya, mesie ya ihe ike,

ma otu mkpụrụ okwu esighị ya nʼọnụ pụta.

E duuru ya pụọ dịka atụrụ a na-aga igbu egbu,

dịka atụrụ a na-akpachapụ ajị ya si anọ nwayọọ nʼihu ndị na-akpacha ya ajị,

otu a ka o si nọdụ na-asagheghị ọnụ ya.

Site na mmegbu na ikpe ka e ji wepụ ya.

Ma, onye nʼetiti ndị ọgbọ1 ya weliri olu kwuo okwu?

Nʼihi na e bipụrụ ya site nʼala ndị dị ndụ;

maka njehie ndị m ka e ji tie ya ihe.2

E nyefere ya ka e lie ya dịka onye na-emebi iwu,

ọ bụkwa nʼetiti ndị ọgaranya ka e liri ya,

ọ bụ ezie na o nweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere,

ọ dịkwaghị okwu aghụghọ si nʼọnụ ya pụta.

Ma ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị ịzọpịa ya, na ime ka ọ taa ahụhụ.

Nʼihi na ọnwụ ya bụ aja a chụrụ nʼihi ikpe ọmụma nke mmehie.

Ọ ga-ahụ ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ya; ọ ga-adịkwa ndụ ogologo oge.

Nzube Chineke niile ga-emezukwa site na ya.

Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ,

ọ ga-emesịa hụ ìhè nke ndụ, afọ ga-ejukwa ya,

site nʼihe ọmụma ya, ka onye ezi omume ahụ, bụ ohu m ga-eme ka a gụọ ọtụtụ mmadụ dịka ndị ezi omume,

ọ ga-ebukwa mmehie ha niile.

Nʼihi ya, aga m enye ya oke nʼetiti ndị bara ụba,3

ọ ga-esokwa ndị bụ dike keta ihe nkwata nʼagha,

nʼihi na ọ wụpụrụ ndụ ya nye ọnwụ,

a gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu.

Ma ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ mmadụ,

rịọọkwara ndị na-emebi iwu arịrịọ.

Source notes (3)
  1. Footnote Ya bụ, kwụpụtara
  2. Footnote Ya bụ, taa ya ahụhụ
  3. Footnote Maọbụ, ndị dị ike

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.