Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Aịzaya 4
Nʼoge ahụ, ndị ikom ole na ole ga-afọdụ ndụ.
Nke a ga-eme ka ndị inyom asaa na-azọ otu nwoke.
Ha ga-abịakwute ya sị ya “Kwere ka anyị niile bụrụ ndị nwunye gị!
Anyị ga-akpara onwe anyị nri,
zụọra onwe anyị akwa. Naanị kwere ka anyị na-aza aha gị,
ka a ghara ịkọ anyị ọnụ.”
Alaka Onyenwe anyị
Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka Alaka Onyenwe anyị mabiga mma oke, ma nwekwa ebube dị ukwuu. Ndị fọdụrụ ndụ nʼIzrel ga-enweta ihe ubi ga-enye ha ọṅụ, na nke ga-ewetara ha obi nganga na mmụọ ịnya isi. Ndị ahapụrụ na Zayọn, ndị nọ na Jerusalem ka a ga-akpọ ndị dị nsọ, bụ ndị ahụ niile e dere aha ha nʼetiti ndị bi nʼime Jerusalem. Onyenwe anyị ga-asachapụ unyi niile nke ndị inyom Zayọn, ọ ga-asachapụkwa ọbara niile dị na Jerusalem site na mmụọ nke ikpe, na mmụọ nke ọkụ. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-ewuru ugwu Zayọn niile na ndị niile zukọrọ nʼebe ahụ ndo ga-ekpuchi ha niile. Ihe ọ ga-eji mee ndo a bụ igwe ojii na anwụrụ ọkụ nke ga-adịrị ha nʼehihie, na ọkụ na-enwu enwu, nke ga-adịrị ha nʼabalị. Ebube ahụ ga-abụ ihe mkpuchi nye ha. Ọ ga-abụrụ ha ebe mgbaba na ndo ime ka okpomọkụ nke ehihie hapụ ịchagbu ha. Ọ ga-abụkwara ha ebe izere ndụ, na ebe nzuzo pụọ nʼoke ifufe na mmiri.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.