Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Aịzaya 33
Nsogbu na enyemaka
Ahụhụ dịrị gị, onye mbibi,
onye bibiri ihe niile dị gị gburugburu, ma ọ dịbeghị mbibi rutere gị aka.
Ahụhụ dịrị gị, onye nrafu,
onye na-enwebeghị ndị rafuru gị.
Mgbe ị kwụsịrị ibibi ihe
ka a ga-ebibi gị,
mgbe ị kwụsịkwara nrafu
ka a ga-arafu gị.
Biko, Onyenwe anyị, nwee obi ebere nʼebe anyị nọ,
nʼihi na ọ bụ gị ka anyị na-ele anya.
Bụụrụ anyị ike nʼụtụtụ ụbọchị niile,
bụrụkwara anyị onye nzọpụta mgbe niile anyị nọ na mkpa.
Ndị iro na-agba ọsọ mgbe ha nụrụ olu gị.
Mgbe ị guzoro ọtọ, mba niile na-agbalaga.
Dịka igurube si atachapụ ihe dị nʼubi,
otu a ka a ga-esi kwakọrọ ihe niile unu nwere nʼagha, unu mba dị iche iche.
Onyenwe anyị dị elu, nʼihi na o bi nʼebe dị elu.
Ọ ga-eji ikpe ya ziri ezi, na ezi omume mejupụta Zayọn.
Ọ ga-abụ ntọala guzosiri ike nke oge unu niile,
ụlọakụ dị ukwu nke nzọpụta, na amamihe na ihe ọmụma;
egwu Onyenwe anyị bụ igodo nke akụ a.
Lee ndị ha dị ike ka ha na-eti mkpu akwa nʼokporoụzọ niile;
ndị na-anọchite anya ha, ndị bịara ikwu otu udo ga-esi dịrị na-akwa akwa.
Ọ dịkwaghị onye a na-ahụ anya nʼokporoụzọ ọbụla.
E meela ka ọgbụgba ndụ niile ghara ịdịkwa ire.
A na-elelị ndị e sitere nʼakaebe ha
mee ka ọgbụgba ndụ ahụ guzosie ike.
Ọ dịkwaghị onye a na-asọpụrụ.
Ala ahụ niile na-eru ụjụ. Ọ tọgbọkwara nʼefu.
Oke ọhịa Lebanọn akpọnwụọla bụrụ ihe ihere.
Sharọn aghọkwaala ọzara;
osisi dị na Bashan na nʼelu ugwu Kamel na-agbụchakwa akwụkwọ ha.
Ma Onyenwe anyị na-asị, “Ugbu a, m ga-ebili.”
“Ugbu a, ka a ga-eme ka m dị elu;1
ugbu a, ka a ga-ebuli m elu.
Unu na-atụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ,
unu na-amụpụta ahịhịa,
nkuume unu na-ekupụta bụ ọkụ ga-erepịa unu.
Ndị gị ga-ere ọkụ, dịka osisi ogwu e gbuturu egbutu tụnye nʼọkụ;
ha ga-ere ọkụ dịka avụvụ nkwụ.”
Geenụ ntị nụrụ ihe m mere, unu mba niile dị nʼebe dị anya!
Unu ndị nọ nso, kwerenụ nʼezie na m siri ike!
Ndị mmehie na ndị ajọ omume nọ na Zayọn na-ama jijiji nʼegwu,
ha na-akwa akwa na-asị,
“Onye nʼime anyị pụrụ ibi nʼebe a, nʼetiti onye a bụ ọkụ na-erepịa erepịa,
ọkụ nke na-ere ruo mgbe ebighị ebi?”
Ndị na-ejegharị nʼezi omume
na-ekwu ihe ziri ezi,
ndị na-ajụ uru sitere nʼụzọ nʼezighị ezi,
ndị na-ewezuga aka ha site na ịnata ngarị dị iche iche,
ndị na-emechi ntị megide izu ịkwafu ọbara,
na-amụchi anya ha abụọ ka ha ghara ịtụgharị uche nʼihe ọjọọ.
Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu,
ndị ebe mgbaba ha ga-abụ ebe e wusiri ike nke ugwu.
A ga-enye ha nri,
mmiri a gaghị akọkwa ha.
Anya unu ga-ahụ eze nʼebube ya;
unu ga-ahụkwa alaeze ya nke nsọtụ oke ya dị nʼebe dị anya.
Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga.
“Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a?
Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ?
Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?”
Nʼoge ahụ, unu agaghị ahụkwa ndị nganga ahụ ọzọ,
bụ ndị ahụ na-asụ asụsụ nke unu na-amaghị,
nke unu na-adịghị aghọtakwa.
Lekwasịnụ Zayọn anya, obodo anyị na-anọ eme mmemme anyị niile;
anya unu ga-ahụkwa Jerusalem,
ụlọ obibi dị jụụ, ụlọ ikwu nke a na-apụghị ibupụ ebupụ;
apụghịkwa iholite ǹtu jidere ya,
maọbụ dọbie nke ọbụla nʼime ụdọ ji ya.
Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-abụrụ anyị Onye dị ike.
Ọ ga-adịkwara anyị ka osimiri na iyi dị obosara.
Ọ dịghị ụgbọ amara
maọbụ ụgbọ ukwu ga-abịa na mmiri ahụ.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ikpe anyị.
Onyenwe anyị bụ onye na-enye anyị iwu.
Onyenwe anyị bụ eze anyị,
ọ bụ ya na-azọpụta anyị.
A tọsaala ụdọ niile:
Ha adịghị ejidesikwa ọkọlọtọ gị ike,
a gbasaghịkwa akwa igbochi ifufe.
Mgbe ahụ, a ga-ekesa ụba ihe a kwatara nʼagha
ọ bụladị ndị ngwụrọ ga-ebute ihe nkwata nʼagha.
Ọ dịkwaghị onye bi na Zayọn ga-asị, “Ahụ esighị m ike,”2
nʼihi na a ga-agbaghara ndị bi nʼime ya mmehie ha niile.
Source notes (2)
- Footnote Mgbe a ga-asọpụrụ m
- Footnote Ana m arịa ọrịa
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.