Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Aịzaya 31

Ahụhụ dịrị ndị ahụ na-atụkwasị Ijipt obi

Ahụhụ dịrị ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka,

ndị nchekwube ha dị nʼike ndị ha na-agba ịnyịnya,

ndị na-atụkwasị obi ha nʼụgbọala ha, nke dị ọtụtụ,

ndị na-atụkwasịkwa obi ha nʼịdị ike nke ndị Ijipt na-agba ịnyịnya.

Ma ha adịghị ele anya inyeaka site nʼaka Onye Nsọ Izrel;

ha adịghị arịọkwa ya ka Onyenwe anyị nyere ha aka.

Ma ya onwe ya maara ihe, ọ pụrụ iweta ịla nʼiyi.

Ọ dịkwaghị agbanwe okwu ya.

Ọ ga-ebili megide ndị mba na-eme ihe ọjọọ;

ha na ndị niile na-enyere ndị na-eme ajọ ihe aka.

Nʼihi na ndị Ijipt bụ naanị mmadụ, ha abụghị Chineke!

Ịnyịnya ha nwekwara anụ ahụ, ha abụghị mmụọ.

Mgbe Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya imegide ha,

ha ga-asọ ngọngọ;

ndị ha na-enyere aka ga-adakwa.

Ha niile ga-alakọkwa nʼiyi.

Ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m,

“Dịka ọdụm na-agbọ ụja,

na-ebigbọ nʼelu anụ ọ dọgburu,

nʼagbanyeghị na-akpọkọtara igwe ndị ọzụzụ atụrụ

imegide ya,

ọ naghị atụ egwu mkpu ha,

mkpọtụ ụzụ ha adịghị enyekwa ya nsogbu,

Otu a kwa, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-arịdata

ibu agha nʼugwu Zayọn, na nʼugwu nta ya niile.

Dịka nnụnụ si efegharị nʼelu akwụ ya ichebe ụmụ ya,

otu a ka mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-esi chebe Jerusalem,

ọ ga-ekpuchi ya napụta ya,

ọ ghaghị ịgabiga ya, gbapụtakwa ya.”

Lọghachitenụ azụ, unu bụ Izrel, laghachikwurunụ onye ahụ nke unu nupuru isi nʼebe ọdị ukwuu megide. Amaara m nke ọma na ụbọchị ahụ na-abịa, mgbe onye ọbụla nʼime unu ga-atụfu arụsị ọlaedo na ọlaọcha niile nke aka mmehie unu kpụrụ.

“Mgbe ahụ, Asịrịa ga-ada, kama ọ bụghị site na mma agha mmadụ,

mma agha na-abụghị nke mmadụ efu ga-erichapụ ha.

Ha ga-esi nʼihu mma agha gbaa ọsọ,

ma ụmụ okorobịa ha ka a ga-akpụrụ tinye nʼọrụ mmanye.

Obodo ha niile e wusiri ike ga-ada nʼihi oke egwu,

ndị ọchịagha ha ga-atụkwa ụjọ mgbe ha hụrụ ọkọlọtọ agha.”

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

Onye ọkụ ya dị na Zayọn,

onye ekwu igwe ọkụ ya dị na Jerusalem.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.