Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Aịzaya 23

Amụma e buru banyere Taịa

Nke a bụ amụma megide Taịa:

Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri nke Tashish

nʼihi na e bibiela Taịa,

ahapụla ya na-enweghị ụlọ ọbụla maọbụ ọnụ mmiri mbata.

Ozi erutela ha aka

site nʼobodo Saiprọs.

Derenụ duu, unu ndị bi nʼala ahụ osimiri gbara gburugburu.

Unu ndị na-azụ ahịa na Saịdọn,

ndị na-ezipụ ụgbọ mmiri na-aga nʼosimiri, kwaanụ akwa.

Nʼelu ọtụtụ mmiri dị ukwuu,

ka mkpụrụ ọkụkụ Shihoa si bịa,

owuwe ihe ubi nke Naịl bụ ihe uru ahịa Taịa,

ọ ghọrọ ọma ahịa nke mba dị iche iche.

Ka ihere mee gị, Saịdọn, na gị bụ ebe e wusiri ike nke osimiri,

nʼihi na oke osimiri ekwuola okwu;

“Ime emetụbeghị m, nke m ji amụpụta nwa;

o nwebeghị mgbe m ji zụpụta ụmụ ndị ikom maọbụ ụmụ ndị inyom tozuru oke.”

Mgbe ozi ga-abịara ndị Ijipt,

ha ga-anọ na mwute nʼihi ozi si Taịa.

Gabiganụ ruo Tashish

tisienụ mkpu akwa ike, unu ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu.

Nke a ọ bụ obodo ahụ ọṅụ na-ejupụta nʼime ya oge niile?

Obodo ahụ dịrịla kemgbe oge gara aga?

Nke a ọ bụ ihe fọdụrụ nʼobodo ahụ

ndị ya na-esi nʼime ya pụọ gaa nʼebe dị anya iwu obodo ọzọ?

Onye zubere ihe dị otu a megide Taịa,

bụ mba na-ekpube ndị ọzọ okpueze,

mba nke ndị ahịa ya bụ ụmụ eze,

nke ndị ọzụ ahịa ya bụ ndị a na-asọpụrụ nʼụwa?

Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere ya,

nʼihi iweda nʼala mpako na ịma mma ya niile,

na iwetara ndị niile a na-asọpụrụ nʼụwa nlelị.

Gaanụ kọọ ala ubi unu dịka ha na-eme nʼakụkụ Naịl,

unu ụmụada Tashish,

nʼihi na unu enwekwaghị ọnụ mmiri.

Onyenwe anyị esetipụla aka ya nʼelu osimiri

mee ka alaeze ha niile maa jijiji.

O nyela iwu banyere Fonisia1

ka e bibie ebe ya niile nke wusiri ike.

Ọ sịrị, “Ị gaghị aṅụrị ọṅụ ịṅụ mmanya nʼoke oriri ọzọ,

gị ada Saịdọn na-amaghị nwoke, nke a na-emegbu emegbu.

“Bilie, gafee garuo Saiprọs,

ọ bụladị nʼebe ahụ, ị gaghị enweta ezumike.”

Lee anya nʼala ndị Kaldịa,

ndị a gụpụrụla ugbu a na mmadụ!

Ndị Asịrịa mere ya

ka ọ bụrụ ebe obibi nye anụ ọhịa na-ebi nʼọzara.

Ha wuliri ụlọ nche ha niile dị elu gburugburu

tikpọọ ebe ya niile e wusiri ike,

mee ha ka ha tọgbọrọ nʼefu ghọọ mkpọmkpọ ebe.

Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri Tashish niile dị nʼoke osimiri,

nʼihi na e mebiela ebe unu niile e wusiri ike.

A gaghị echeta Taịa ọzọ, tutu iri afọ asaa agafee, nke bụ ogologo ụbọchị ndụ onye eze. Mgbe oge ahụ zuru, Taịa ga-adịkwa ka nwanyị akwụna e jiri rọọ abụ dị otu a:

“Welite ụbọ akwara, jegharịa nʼime obodo,

gị nwanyị akwụna e chefuru echefu;

kpọzie ụbọ gị nke ọma, bụọ ọtụtụ abụ,

ka e si otu a mee ka ị bụrụ onye e chetara echeta.”

E, mgbe iri afọ asaa gasịrị, Onyenwe anyị ga-eleta Taịa. Ọ ga-alaghachi nʼọrụ ya dịka nwanyị akwụna, ya na alaeze niile dị nʼihu elu ụwa niile. Ma uru ahịa ya niile, na ego niile ọ kpatara site nʼịzụ ahịa ka ọ ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị. Ha agaghị edokọkwa ha nʼotu ebe izo ha, kama uru ahịa ha niile ga-adịrị ndị niile na-ebi ezi ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ga-ejikwa ego ahụ zụọ ihe oriri na uwe dị mma.

Source notes (1)
  1. Footnote Ya bụ, Kenan

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.