Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Aịzaya 18
Amụma e buru banyere Kush
Ahụhụ ga-adịrị ala ahụ a na-anụ ụzụ ọtụtụ nku nʼime ya,1
ala ahụ dị nʼofe iyi ukwu niile nke Kush.2
Ala nke na-ezipụ ndị ozi ya site nʼosimiri,
bụ ndị na-eji ụgbọ mmiri papịrọs nʼaga nʼelu mmiri.
Gaanụ ngwangwa, unu ndị ozi dị nkọ
gakwuru ndị toro ogologo nke ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ,
gakwuru ndị a na-atụ egwu nʼebe niile,
mba na-achọ okwu na ụka, nke na-azọpịakwa azọpịa,
ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha.
Unu niile bi nʼelu ụwa dum,
na unu ndị nwere ebe obibi nʼụwa, geenụ m ntị.
Mgbe e buliri ọkọlọtọ elu nʼelu ugwu niile,
lee anya;
mgbe a fụrụ opi ike,
gee ntị.
Nʼihi na ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị gwara m,
“Aga m anọ jụụ na-elepụ anya site nʼebe obibi m,
dịka mgbe igirigi na-ada nʼoge okpomọkụ nke owuwe ihe ubi,
na dịka anyanwụ si acha nʼoge okpomọkụ.”
Nʼihi na tupu oge owuwe ihe ubi eruo, mgbe ifuru dapụsịrị,
mgbe okoko na-aghọ mkpụrụ vaịnị nke ka na-achata achata,
ọ ga-eji mma oge gbuchapụ ụmụ alaka ya,
ọ ga-egbutu ma wezugakwa alaka ndị ahụ na-awasa awasa.
A ga-ahapụ ozu ndị agha ha
ka anụ ufe nke ugwu na ụmụ anụ ọhịa rie ha.
Ụmụ nnụnụ ga-eri anụ ha nʼoge okpomọkụ,
ma ụmụ anụ ọhịa ga-eri ha nʼoge oyi.
Ma mgbe ahụ, a ga-ewetara Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile onyinye dị iche iche,
site na ndị toro ogologo, ndị ahụ na-akwọ mụrụmụrụ,
site na ndị a na-atụ egwu nʼebe niile,
bụ mba ndị okwu na ụka,3 nke na-azọpịakwa azọpịa,
ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha.
A ga-eweta onyinye4 a nʼUgwu Zayọn, nʼebe ahụ a na-akpọku aha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Source notes (4)
- Footnote Maọbụ, ụzụ igurube
- Footnote Nʼoge Aịzaya onye amụma, ndị Kush nʼachị Ijipt. Mgbe ha chọrọ ibuso ndị Asịrịa agha, ha rịọrọ ndị Palestin ka ha nyere ha aka.
- Footnote Maọbụ, asụsụ dị iche
- Footnote Abụ 72:10; Aịz 16:2; Zef 3:10
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.