Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Hosiya 3

Hosiya na nwunye ya adịrịkwa na mma

Onyenwe anyị gwara m ọzọ, “Gakwuru nwanyị a na-akwa iko, nke na-emekwa enyi na-ezighị ezi, gosi ya ịhụnanya gị dịka Onyenwe anyị si hụ ndị Izrel nʼanya, nʼagbanyeghị na ha na-eso chi ndị ọzọ na-enwekwa mmasị dị ukwuu nʼachịcha nsọ e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee.”

Nʼihi ya, eweere m ego ọlaọcha dị iri na ise, na otu ntụju ọka homa, na ọka balị zụta ya. Mgbe ahụ agwara m ya, “Mụ na gị ga-ebi ọtụtụ ụbọchị, ị gaghị agbakwa akwụna, maọbụ nwee nwoke ọbụla gị na ya ga-enwe mmekọ, otu a ka m ga-emekwa nʼebe ị nọ.”

Nke a na-egosi na Izrel ga-anọ ogologo mgbe na-enweghị eze maọbụ onye ọchịchị. Ọ gaghị enwe ịchụ aja maọbụ nkume nsọ maọbụ efọọd maọbụ arụsị ezinaụlọ. Mgbe nke a gasịrị, Izrel ga-alọghachi, chọọ Onyenwe anyị bụ Chineke ha, na Devid bụ eze ha. Ha ga-ewere ịma jijiji bịakwute Onyenwe anyị, bịaghachitekwa ngọzị ya nʼoge ikpeazụ a.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.