Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Emọs 9

A ga-ebibi Izrel

Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ guzo nʼakụkụ ebe ịchụ aja, ọ sịrị,

“Tie ọnụ ogidi ndị a ihe,

ruo mgbe mbata ọnụ ụzọ ha niile mara jijiji.

Tipịasịa ha nʼisi mmadụ niile;

aga m ejikwa mma agha gbuo ndị niile fọdụrụ.

Ọ dịghị onye ga-agbapụ,

ọ dịkwaghị onye ga-ewezuga onwe ya.

Ọ bụrụ na ha egwuo ala ruo nʼala mmụọ,

site nʼebe ahụ ka aka m ga-esi dọlie ha,

ọ bụrụkwa na ha arịgoruo ime eluigwe,

site nʼebe ahụ ka m ga-esi wedata ha nʼala.

Ọ bụrụkwa na ha ezoo onwe ha nʼelu Kamel

nʼebe ahụ ka m ga-esi chọpụta ha, kpụrụ ha,

a sịkwa na ha ezoo onwe ha nʼala oke osimiri,

nʼebe ahụ ka m ga-enye ajụala nke mmiri iwu ka ọ taa ha.

Ọ bụrụ na a dọta ha nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ,

nʼebe ahụ aga m enye mma agha iwu ka o gbuo ha.

“Aga m elekwasị ha anya m abụọ

nʼihi ime ha ihe ọjọọ, ọ bụghị ihe ọma.”

Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,

onye na-emetụ ala aka mee ka ọ gbazee,

ime ka ndị niile bi nʼala ruo ụjụ;

ala ya niile bilie na-ebili dịka mmiri nke osimiri Naịl,

nke na-emesịakwa dajụọ dịka mmiri Ijipt.

Onye na-ewu ụlọ elu ya nʼeluigwe niile,

na-eme ka ntọala ya dị nʼụwa.

Onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku,

ma na-awụsa ha nʼala,

aha ya bụ Onyenwe anyị.

“Ọ bụ na unu ndị Izrel

adịghị ka ndị Kush nʼebe m nọ?”

Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

“Ọ bụ na-esighị m nʼala Ijipt kpọpụta Izrel,

site na Kafto kpọpụta ndị Filistia,

ma kpọpụtakwa ndị Aram site na Kia?

“Nʼezie, anya Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị

nʼahụ alaeze ahụ nke na-emehie.

Aghaghị m ịla ya nʼiyi,

kpochapụ ya site nʼelu ụwa,

naanị na m agaghị ebibicha

ụlọ Jekọb kpamkpam.”

Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

“Ma lee, mụ onwe m gaje inye iwu,

aga m ayọgharị ụlọ Izrel

nʼetiti mba niile

dịka e si ayọgharị ọka nʼime nyọ,

ma ọ dịghị otu mkpụrụ ọka nʼime ya nke ga-ada nʼala.

Ma ndị mmehie ahụ niile nọ nʼetiti ndị m,

ndị ahụ na-asị, ‘Mbibi agaghị erute anyị,

anyị agaghị ezute ya,

aghaghị ịnwụ site na mma agha.’

Nlọta ndị Izrel

“Nʼụbọchị ahụ,

“aga m emekwa ka ụlọ ikwu Devid dara ada guzoziekwa.

Aga m emezi akụkụ ya niile gbajiri agbaji,

mee ka akụkụ ya niile dakpọsịrị adakpọsị guzozie dịka ọ dị na mbụ.

Aga m ewugharịkwa ya, mee ka ọ dịrị ka ọ dị na mbụ.

Ka ha nwee ike inweta ndị fọdụrụ nʼEdọm

tinyere mba niile dị iche iche bụ nke a kpọkwasịrị aha m.”

Otu a ka Onyenwe anyị onye ga-emezu ihe ndị a niile kwubiri ya.

“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,

“Mgbe onye na-akọ ubi ga-agafe onye na-ewe ihe ubi,

onye na-agha mkpụrụ ka onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị ga-agafekwa.

Mmanya ọhụrụ ga-esitekwa nʼelu ugwu na-atapụta,

ọ ga-esitekwa nʼugwu nta niile na-asọpụta.

Aga m emekwa ka ndị m bụ Izrel site nʼobodo a dọtara ha nʼagha lọta.1

“Ha ga-ewugharị obodo niile tọgbọrọ nʼefu, birikwa nʼime ha.

Ha ga-akụ ubi vaịnị a gbara ogige, ṅụọkwa mmanya si na ya.

Ha ga-arụkwa ubi a gbara ogige, riekwa mkpụrụ si na ya.

Aga m akụ Izrel nʼala ha.2

A gaghị ehopukwa ha ọzọ

site nʼala ahụ bụ nke m nyere ha.”

Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Chineke unu kwuru.

Source notes (2)
  1. Footnote Aga m emekwa ka ndị m Izrel nwetakwa ihe ọma niile.
  2. Footnote Ya bụ, ime ka ha biri nʼala ha

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.